ISI NKE 52
Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị Echiche
Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ụdị ákwà na-amasị ya iyi na otú na-adị ya mma isi eji ejiji. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe dị iche iche Baịbụl kwuru gbasara iyi ákwà na iji ejiji, anyị ga na-eji ụdị ejiji na-amasị ma anyịnwa ma Jehova. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru.
1. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịma ụdị ákwà anyị ga na-eyi na otú anyị kwesịrị isi na-eji ejiji?
Anyị kwesịrị ịna-eji ‘ejiji dị mma, nke na-egosi na anyị na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma.’ Anyị kwesịkwara ịna-adị ọcha, si otú ahụ gosi na anyị “na-efe Chineke.” (1 Timoti 2:9, 10) Ka anyị leba anya n’ihe anọ Baịbụl kwuru: (1) Ejiji anyị kwesịrị ‘ịdị mma.’ Ọ̀ kwa ị chọpụtala na onye ọ bụla n’ime anyị na-eji ụdị ejiji na-amasị ya abịa ọmụmụ ihe anyị? N’agbanyeghị ya, ma ụdị ákwà anyị na-eyi ma ụdị isi anyị na-eme ma ọ bu nke anyị na-akpụ na-egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke anyị na-efe. (2) Anyị kwesịrị ‘ịna-emeru ihe n’ókè.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị agaghị na-eji ejiji ga-eme ka ndị ọzọ chewe gbasara mmekọahụ ma ọ bụkwanụ mee ka ha na-agba anyị nkiri. (3) Anyị kwesịrị ‘ịna-ele ihe anya otú dị mma.’ Anyị na-egosi na anyị na-ele ihe anya otú dị mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị amalite iji ejiji ọ bụla anyị hụrụ naanị maka na ọ na-ewu ewu. (4) Ejiji anyị kwesịrị igosi mgbe niile na anyị “na-efe Chineke.” Ọ ga-egosi ndị ọzọ na ọ bụ ezi Chineke ka anyị na-efe.—1 Ndị Kọrịnt 10:31.
2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji cheta ụmụnna anyị mgbe anyị na-ekpebi ụdị ejiji anyị ga-eji?
Ọ bụ eziokwu na anyị nweere onwe anyị iji ejiji ọ bụla masịrị anyị, ma anyị kwesịrị ịchọpụta ma ụdị ejiji anyị chọrọ iji ọ̀ ga-enye ndị ọzọ nsogbu n’obi. Anyị na-eme ike anyị niile ka anyị ghara ime ihe ga-ewute onye ọ bụla. Kama ime ihe ga-ewute mmadụ, “anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi [anyị] ma na-emere ya ihe dị mma, ka e wee gbaa ya ume.”—Gụọ Ndị Rom 15:1, 2.
3. Olee otú ejiji anyị nwere ike isi mee ka ndị ọzọ chọwa ife Jehova?
Ọ bụ eziokwu na anyị na-eji ejiji dị mma mgbe niile, ma mgbe anyị na-akacha eji ejiji dị mma bụ mgbe anyị na-aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. Anyị achọghị ka ejiji anyị mee ka ndị mmadụ ghara ịnụ ozi ọma dị mkpa anyị na-ezi ha. Ihe anyị chọrọ bụ ka o mee ka ha chọọ ịbịa soro anyị fewe Jehova nakwa ka ọ “na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị . . . mma.”—Taịtọs 2:10.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú anyị ga-esi amata ma ụdị ákwà anyị na-eyi na otú anyị si eji ejiji hà ga-egosi ndị ọzọ na anyị bụ Ndị Kraịst.
Ejiji anyị nwere ike igosi ma ànyị na-akwanyere ndị ọrụ gọọmentị ùgwù. N’agbanyeghị na Jehova ma ihe dị anyị n’obi, ejiji anyị kwesịkwara igosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù
4. Anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù ma anyị na-eji ejiji dị mma
Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji echebara ejiji anyị echiche? Gụọnụ Abụ Ọma 47:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị ga-esi na-eji ejiji ma anyị na-echeta mgbe niile na anyị na-anọchite anya Jehova?
Ì chere na anyị kwesịrị ichebara ụdị ejiji anyị na-eji aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma echiche? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
5. Otú anyị ga-esi ama ụdị ákwà anyị kwesịrị ịna-eyi na ụdị ejiji anyị kwesịrị ịna-eji
Ma ákwà anyị yi ọ̀ dị oké ọnụ ma ọ bụ na ọ dịghị, o kwesịrị ịdị ọcha ma kwesị ekwesị maka ebe anyị yi ya gaa. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:24 na 1 Timoti 2:9, 10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ihe mere na anyị ekwesịghị ịna-eyi ákwà ndị . . .
na-adịghị ọcha ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị maka ihe a bịara.
na-atapara n’ahụ́, ndị na-ahụ ụzọ, ma ọ bụ ndị na-eme ka ndị ọzọ chewe gbasara mmekọahụ.
Ọ bụ eziokwu na iwu ejighị Ndị Kraịst idebe Iwu Mosis, anyị nwere ike isi na ya mata otú Jehova si ele ihe anya. Gụọnụ Diuterọnọmi 22:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-eyi ákwà na-eme ka ụmụ nwoke yie ụmụ nwaanyị ma ọ bụ nke na-eme ka ụmụ nwaanyị yie ụmụ nwoke?
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:32, 33 na 1 Jọn 2:15, 16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji chọpụta ma otú anyị si eji ejiji ọ̀ na-ewute ụfọdụ ndị agbata obi anyị ma ọ bụ ndị ọgbakọ anyị?
Olee ụdị ákwà ndị mmadụ na-eyi ma ọ bụ ụdị ejiji ha na-eji n’ebe i bi?
Ì chere na e nwere ụdị ejiji ha na-eji Onye Kraịst na-ekwesịghị ịna-eji? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
N’agbanyeghị na e nwere ụzọ dịgasị iche iche anyị nwere ike isi jie ejiji, ejiji anyị ka nwere ike ịdị Jehova mma
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha nweere onwe ha iyi ihe ọ bụla masịrị ha.
Ì kwetara ihe a ha na-ekwu? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
NCHỊKỌTA
Ọ bụrụ na anyị ana-eji ejiji dị mma, anyị na-akwanyere Jehova na ndị ọzọ ùgwù.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere Jehova ejighị ụdị ákwà anyị na-eyi na otú anyị si eji ejiji egwu egwu?
Olee ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru ndị ga-enyere anyị aka ịma ejiji dị mma anyị kwesịrị ịna-eji?
Olee otú ndị mmadụ nwere ike isi na-ele ofufe anyị na-efe Jehova anya n’ihi otú anyị si eji ejiji?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú ndị ọzọ nwere ike isi na-ele gị anya n’ihi ụdị ejiji ị na-eji.
Chọpụta ihe mere o ji dị mma ka i chee ihe dị n’igbu egbugbu echee tupu gị egbuo egbugbu.
“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Igbu Egbugbu?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Leba anya n’ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịna-ele otú ị dị anya otú kwesịrị ekwesị.
Chọpụta otú otu nwaanyị chọrọ ife Chineke si malite ile ndị ọzọ anya otú dị mma n’agbanyeghị ụdị ejiji na-amasị ha iji?
“Uwe na Ejiji Bụụrụ M Ihe Mgbochi” (Teta!, Disemba 22, 2003)