-
A Matala Onye Nọ na Nzuzo Na-achị ỤwaỤlọ Nche—2011 | Septemba 1
-
-
Kemgbe ahụ, Ekwensu maara na oge o nwere tupu e bibie ya fọrọ obere. Ọ bụ eziokwu na “ụwa dum dị n’aka” ya, e nwere ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa taa bụ́ ndị na-ekweghị ka o duhie ha n’agbanyeghị mbọ niile ọ na-agba. Baịbụl emeela ka ha mata ụdị onye Ekwensu bụ na aghụghọ ya. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) Ihe Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya emeela ka obi sie ndị ahụ na-ekweghị ka Ekwensu duhie ha ike. Pọl sịrị: “Chineke nke na-enye udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu n’oge na-adịghị anya.”b—Ndị Rom 16:20.
-
-
A Matala Onye Nọ na Nzuzo Na-achị ỤwaỤlọ Nche—2011 | Septemba 1
-
-
b N’amaokwu a, Pọl kwughachiri ihe e dere na Jenesis 3:15, bụ́ amụma mbụ e dere na Baịbụl nke gosiri na a ga-emecha bibie Ekwensu. Okwu Pọl ji kọwaa mbibi ahụ a ga-ebibi Ekwensu bụ okwu Grik nke pụtara “itipịa ihe, ịkụri ihe, igweri ihe.”—Akwụkwọ bụ́ Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words.
-