-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2003 | Jenụwarị 1
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a”?
N’izo aka ná nguzobe nke Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs, Pọl dere, sị: “N’oge nile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.” (1 Ndị Kọrint 11:25, 26) Ụfọdụ ndị chere na okwu ahụ bụ́ ‘oge nile’ nke e ji mee ihe n’ebe a na-egosi na e kwesịrị ịdị na-eme ememe ncheta ọnwụ Kraịst ugboro ugboro, n’echiche nke ime ya ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, ha na-eme ya ihe karịrị otu ugboro n’afọ. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe Pọl bu n’uche?
Ọ fọziri nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 eri Jizọs guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya. N’ihi ya, ime Ememe Ncheta ahụ ọbụna otu ugboro n’afọ pụtara na e mewo ya ọtụtụ ugboro kemgbe afọ 33 O.A. Otú ọ dị, ihe Pọl na-ekwu ná 1 Ndị Kọrint 11:25, 26 abụghị ugboro ole e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta ahụ, kama ọ bụ otú e kwesịrị isi na-eme ya. Na Grik mbụ, o jighị okwu bụ́ pol·laʹkis, bụ́ nke pụtara “mgbe mgbe” ma ọ bụ “ugboro ugboro” mee ihe. Kama nke ahụ, o ji okwu bụ́ ho·saʹki, bụ́ nke pụtara ‘n’oge nile a na-eme,’ bụ́ okwu nke pụtara “mgbe ọ bụla,” “oge ọ bụla a na-eme.” Ihe Pọl na-ekwu bụ: ‘Oge ọ bụla unu na-eme nke a, unu na-anọgide na-akpọsa ọnwụ Onyenwe anyị.’a
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2003 | Jenụwarị 1
-
-
a Tụlee ihe ndekọ dị na 1 Samuel 1:3, 7. N’ebe ahụ, “mgbe ọ bụla” (ná nsụgharị ọgbara ọhụrụ nke Hibru) na-ezo aka n’ihe ndị e mere “site n’afọ ruo n’afọ,” ma ọ bụ otu ugboro n’afọ, bụ́ mgbe Elkana na ndị nwunye ya abụọ na-aga n’ụlọikwuu dị na Shaịlo.
-