-
Gịnị Dị Njọ n’Ịkpa Ego?Teta!—1997 | Ọktoba 8
-
-
Bible na-elebara ajụjụ ndị a kpọmkwem anya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9,10.
-
-
Gịnị Dị Njọ n’Ịkpa Ego?Teta!—1997 | Ọktoba 8
-
-
Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl na-asị na ‘ịhụ ego n’anya nke na-eri isi bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche.’ N’ihi ya, ọtụtụ abụrụwo ndị ‘e duhiere n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.’ Were, dị ka ihe atụ, otu onye ntorobịa anyị ga-akpọ Obinna. Mgbe ọ dị afọ 12 ọ malitere ịgba chaa chaa. “Ọ bụ ụzọ isi nweta ego n’arụghị ọrụ ọ bụla,” ka ọ na-echeta. N’oge na-adịghị anya, ọ banyewo n’ụgwọ nke ọtụtụ narị dollar, na-elegharakwa ndị enyi, ezinụlọ, na ọrụ ụlọ akwụkwọ anya. “Agbalịrị m isepụ aka,” ka ọ na-ekweta, ma ọ dara ugboro ugboro. Ọ gara n’ihu ‘jiri ọtụtụ ihe mgbu na-adụpu onwe ya’ ruo mgbe ọ chọrọ enyemaka n’afọ 19. N’ihi ya onye edemede bụ́ Douglas Kennedy adịghị ekwubiga okwu ókè mgbe, n’akwụkwọ ya bụ́ Chasing Mammon, ọ kpọrọ nchụso ego “ahụmahụ na-akpọnwụ ahụ.”
-