Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Mgbapụta Ruru Eru n’Ihi Mmadụ Nile
    Ụlọ Nche—1991 | Febụwarị 15
    • Ihe Mgbapụta Ruru Eru

      10. N’ihi gịnị ka àjà ụmụ na-apụghị ikpuchi mmehie nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu?

      10 Nkọwa ndị e nyeworo na-egosi na ihe mgbapụta aghaghị ịbụ ihe ya na ihe ọ na-anọchi anya ya, ma ọ bụ ihe ọ na-ekpuchi, hà nhata. Àjà ụmụ anụmanụ nke ndị nwere okwukwe site n’Ebel gaa n’ihu chụrụ apụghị ikpuchi mmehie mmadụ n’ezie, ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ dị elu karịa ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị uche. (Abụ Ọma 8:4-8) Otú a, Pọl pụrụ ide na “ọbara nke oké ehi na nke ewu apụghị iwepụ mmehie.” Àjà ndị dị otú ahụ pụrụ ịnọ nanị dị ka mkpuchi ihe onyinyo, ma ọ bụ nke ihe atụ, n’ichere ihe mgbapụta ahụ nke gaje ịbịa.—Ndị Hibru 10:1-4.

      11, 12. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị mkpa ka ọtụtụ puku nde mmadụ nwụọ ọnwụ ọchụchụ àjà iji kpuchie mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Ọ̀ bụ nanị ònye pụrụ ije ozi dị ka “ihe mgbapụta ruru eru,” nzube dị aṅaa ka ọnwụ ya na-emezukwa?

      11 Ihe mgbapụta nke a e sere onyinyo ya aghaghị ịbụ nke ya na Adam hà nhata, ebe ọ bụ na amamikpe ọnwụ ahụ nke Chineke mara Adam n’ụzọ ikpe ziri ezi rụpụtara amamikpe nye agbụrụ mmadụ dum. Ndị Kọrint nke Mbụ 15:22 na-asị, “Ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” Ya mere, ọ dịghị mkpa ka ọtụtụ puku nde ụmụ mmadụ n’otu n’otu nwụọ ọnwụ ọchụchụ àjà iji wee mee ihe kwekọrọ na nke ọ bụla n’ụmụ Adam. “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa.” (Ndị Rom 5:12) ‘Ebe ọnwụ sitekwara n’aka mmadụ,’ ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụkwara ịbịa ‘site n’aka mmadụ.’—1 Ndị Kọrint 15:21.

      12 Mmadụ nke pụrụ ịbụ ihe mgbapụta ahụ aghaghị ịbụ onye zuru okè nke nwere anụ ahụ na ọbara—ihe ya na Adam hà nhata kpọmkwem. (Ndị Rom 5:14) Onye bụ mmụọ ma ọ bụ “onye bụ Chineke, bụrụkwa mmadụ” agaghị eme ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi guzozie. Ọ bụ nanị mmadụ zuru okè, onye na-anọghị n’okpuru amamikpe ọnwụ ahụ Adam wetara, pụrụ inye “ihe mgbapụta ruru eru” bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ zuru okè n’ebe Adam nọ. (1 Timoti 2:6, NW)a Site n’iwepụta onwe ya iji ndụ ya chụọ àjà, “Adam ikpeazụ” nke a pụrụ ịkwụ ụgwọ nke mmehie ‘mmadụ mbụ ahụ bụ Adam.’—1 Ndị Kọrint 15:45; Ndị Rom 6:23.

  • Ihe Mgbapụta Ruru Eru n’Ihi Mmadụ Nile
    Ụlọ Nche—1991 | Febụwarị 15
    • a Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a, bụ́ an·tiʹly·tron, apụtaghị ebe ọ bụla ọzọ n’ime Bible. E nwere njikọ dị n’etiti ya na okwu ahụ Jisọs jiri mee ihe maka ihe mgbapụta (lyʹtron) na Mak 10:45. Otú ọ dị, Akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology na-eme ka ọ pụta ìhè na an·tiʹly·tron ‘mesiri ike echiche nke ime mgbanwerịta.’ N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, nsụgharị New World Translation dere ya “ihe mgbapụta ruru eru.”

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya