-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2003 | Disemba 15
-
-
A ghaghị imesi ya ike na ọbụna tupu nke a, mgbe ndị ajọ mmụọ ahụ ka nwere ohere ịba n’eluigwe, ha bụ ndị a mapụrụ n’iwu n’ezinụlọ Chineke, nọrọkwa ná mmachibido iwu doro anya. Dị ka ihe atụ, Jud amaokwu nke 6 kpughere na narị afọ mbụ O.A., ‘e jiriworịị agbụ ebighị ebi debe ha n’okpuru oké ọchịchịrị ime mmụọ maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.’ N’otu aka ahụ, 2 Pita 2:4 na-ekwu, sị: “N’ezie ọ bụrụ na Chineke alaghị azụ n’inye ndị mmụọ ozi ahụ mehierenụ ahụhụ, kama, site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs [ọnọdụ nke ịbụ ndị a chụpụrụ nnọọ achụpụ], o nyefere ha n’olulu nke oké ọchịchịrị [ime mmụọ] ịbụ ndị e debere maka ikpe.”b
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2003 | Disemba 15
-
-
b Pita onyeozi ji ọnọdụ mmapụ iwu ime mmụọ a tụnyere ịnọ “n’ụlọ mkpọrọ.” Otú ọ dị, ọ dịghị ekwu banyere “abis” a ga-enwe n’ọdịnihu bụ́ ebe a ga-atụba ndị mmụọ ọjọọ ruo otu puku afọ.—1 Pita 3:19, 20; Luk 8:30, 31; Mkpughe 20:1-3.
-