Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 10. Ihe dị aṅaa nke na-agba ume ka Jisọs hụtara n’ime ọgbakọ ahụ dị na Sadis, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị?

      10 Okwu ndị ọzọ Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Sadis na-enye agbamume dị ukwuu. Ọ sịrị: “Ma i nwere aha ole na ole na Sadis ndị na-emerụghị uwe ha: ha ga-esokwa m na-ejegharị n’ime uwe ọcha; n’ihi na ha bụ ndị kwesịrị. Onye na-emeri emeri ka a ga-egbokwasị uwe ọcha otú a; m gaghị ehichapụkwa aha ya n’ime akwụkwọ nke ndụ nke m ma ọlị, m ga-ekwupụtakwa aha ya n’ihu Nna m, na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.” (Mkpughe 3:4, 5) Ọ̀ bụ na okwu ndị a adịghị akpali anyị iwusi mkpebi anyị ike ịbụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi? Site n’òtù ndị okenye ileghara ihe anya dị ka otu òtù, ọgbakọ dum pụrụ ịdaba n’oké ụra ime mmụọ. Ma, ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ahụ pụrụ iji obi ike mee mgbalị ịnọgide dị ka ndị Kraịst dị ọcha, ndị na-enweghịkwa ntụpọ, wee si otú a nọgide na-enwe ezi aha n’ebe Jehova nọ.—Ilu 22:1.

  • Aha Gị Ọ̀ Dị n’Akwụkwọ nke Ndụ?
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 13. Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị “na-emerụghị uwe ha”?

      13 Ndị ahụ nọ na Sadis, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ, ndị na-emetọghịkwa ihe e ji mara ha dị ka ndị Kraịst na-enweta mmezu nke olileanya dị ebube. Mgbe e guzobesịrị Alaeze Mesaịa nke Jisọs na 1914, a na-akpọlite ha gaa ná ndụ dị ka mmụọ, dịkwa ka ndị na-enwe mmeri, a na-eyikwasị ha uwe ọcha dị ka ihe nnọchianya nke ezi omume ha na-enweghị ntụpọ. Ebe ha jeworo ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduje ná ndụ, ha ga-enweta nkwụghachi ụgwọ ebighị ebi.—Matiu 7:14; leekwa Mkpughe 6:9-11.

      Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Ime Akwụkwọ nke Ndụ!

      14. Gịnị bụ “akwụkwọ nke ndụ” ahụ, aha olee ndị kwa ka e debara n’ime ya?

      14 Gịnị bụ “akwụkwọ nke ndụ” ahụ, ọ̀ bụkwa aha ole ndị na-adịgide n’ime ya? Akwụkwọ, ma ọ bụ akwụkwọ mpịakọta, nke ndụ ahụ na-ezo aka n’ihe ndekọ nke ndị ohu Jehova ndị ga-anata onyinye nke ndụ ebighị ebi. (Malakaị 3:16) Ná Mkpughe ebe a, e zoro aka kpọmkwem n’aha ndị Kraịst e tere mmanụ. Ma e dekọkwara aha ndị ga-anata ndụ ebighị ebi n’elu ala n’ime ya. Ọzọkwa, a pụrụ ‘ihichapụ’ aha ndị mmadụ n’akwụkwọ ahụ. (Ọpụpụ 32:32, 33) Otú ọ dị, ndị ahụ so n’òtù Jọn ndị aha ha na-adịgide n’akwụkwọ nke ndụ ahụ ruo mgbe ha nwụrụ na-enweta ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (Mkpughe 2:10) Ọ bụ aha ndị a ka Jisọs na-ekwupụta n’ihu Nna ya na n’ihu ndị mmụọ ozi Ya n’ụzọ pụrụ iche. Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ oké ụgwọ ọrụ!

      15. Olee otú ndị oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi mee ka e deba aha ha n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ?

      15 Oké ìgwè mmadụ ahụ ndị e dekwara aha ha n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ, ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta ná ndụ. Site n’ịnọgide n’okwukwe n’oge nile nke Ọchịchị Puku Afọ Jisọs nakwa n’oge oké ule ahụ nke ga-esochi ya, a ga-eji ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ala kwụghachi ndị a ụgwọ. (Daniel 12:1; Mkpughe 7:9, 14; 20:15; 21:4) Mgbe ahụ, aha ha ga-abanye n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ. N’ịmara ihe e si n’ọnụ mmụọ nsọ kwupụta n’ebe a, ọ̀ bụ na ị dịghị eji ịnụ ọkụ n’obi na-azaghachi n’òkù ahụ Jisọs na-akpọ mgbe mgbe, sị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst”?—Mkpughe 3:6.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya