Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Jidesie Ihe I Nwere Ike”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 10. Agbamume dị aṅaa ka Jisọs nyere ọgbakọ ahụ dị na Filadelfịa?

      10 Ebe ha sitere n’ọnụ onye nwere ike otú a, okwu Jisọs gwara ndị Kraịst nọ na Filadelfịa aghaghị ịbụ ihe agbamume pụrụ iche! Ọ jara ha mma, na-asị: “Amatara m ọrụ gị nile (lee, enyewo m gị ọnụ ụzọ nke e megheworo n’ihu gị, nke onye ọ bụla na-apụghị imechi), na i nwere ike nta, i debekwara okwu m, ị gọnarịghịkwa aha m.” (Mkpughe 3:8) Ọgbakọ ahụ anọwo na-arụsi ọrụ ike, e meghewokwa otu ọnụ ụzọ n’ihu ya—nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ọnụ ụzọ nke na-eduba n’ohere nke ije ozi dị ka ndị na-eje ozi. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 16:9; 2 Ndị Kọrint 2:12.) N’ihi nke a, Jisọs gbara ndị okenye ahụ ume ijiri ohere ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu ikwusa ozi ọma. Ha enwewo ntachi obi, gosikwa na ha nwere ike zuru ezu, site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ịnọgide na-arụ “ọrụ” ndị ọzọ n’ozi Jehova. (2 Ndị Kọrint 12:10; Zekaraịa 4:6) Ha erubewo isi n’iwu nile nke Jisọs, ha agọnarịghịkwa Kraịst, site n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’omume ha.

  • “Jidesie Ihe I Nwere Ike”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 14. N’ụzọ dị aṅaa ka Aịsaịa 49:23 na Zekaraịa 8:23 siworo nwee mmezu pụtara ìhè n’oge anyị a?

      14 N’oge anyị a, amụma ndị dị ka Aịsaịa 49:23 na Zekaraịa 8:23 enwewo nnọọ mmezu pụtara ìhè. Dị ka ihe si n’ọrụ nkwusa nke òtù Jọn ahụ, ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu abanyewo site n’ọnụ ụzọ ahụ e megheworo gaa n’ọrụ Alaeze.b Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a esiwo na Krisendọm pụta, bụ́ nke okpukpe ya nile na-eme nzọrọ na-abụghị eziokwu na ha bụ Israel ime mmụọ. (Tụlee Ndị Rom 9:6.) Ndị a, dị ka oké ìgwè mmadụ, sara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha site n’inwe okwukwe n’ọbara Jisọs ji chụọ àjà. (Mkpughe 7:9, 10, 14) Site n’irubere ọchịchị Alaeze Kraịst isi, ha nwere olileanya ịnata ngọzi ya n’elu ala ebe a. Ha na-abịakwute ụmụnna Jisọs ndị e tere mmanụ, ‘na-akpọkwa isi ala’ nye ha n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na ‘ha anụwo na Chineke nọnyeere ha.’ Ha na-ejere ndị a e tere mmanụ ozi, bụ́ ndị a na-ejikọta ha na ha dị ka otu òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.—Matiu 25:34-40; 1 Pita 5:9.

  • “Jidesie Ihe I Nwere Ike”
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • b Magazin Ụlọ Nche nke òtù Jọn ahụ na-ebipụta, anọgidewo na-emesi ike ịdị ngwa nke iji ohere a kere òkè n’ụzọ zuru ezu ruo ókè o kwere mee n’ọrụ nkwusa ahụ; dị ka ihe atụ, lee isiokwu bụ́ “Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova” nakwa “n’Ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru,” bụ́ ndị dị ná mbipụta January 1, 2004. Ná mbipụta June 1, 2004, n’isiokwu bụ́ “Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ,” e mesiri mkpa ọ dị ike ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ nke e megheworo’ nke na-eduba n’ozi oge nile. E nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,093,552 ndị ọsụ ụzọ nyere akụkọ ozi dị otú ahụ n’ime otu ọnwa n’afọ 2005.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya