-
Ịka Israel nke Chineke AkaraMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
Ifufe Anọ nke Ụwa
3. (a) Ozi pụrụ iche dị aṅaa nke ndị mmụọ ozi na-eje ka Jọn hụrụ? (b) Gịnị ka “ifufe anọ” ndị ahụ sere onyinyo ha?
3 Tupu Jehova atọhapụ ọnụma ya, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe rụrụ otu ọrụ pụrụ iche. Jọn na-ahụ nke a ugbu a n’ọhụụ: “Mgbe nke a gasịrị m wee hụ ndị mmụọ ozi anọ ka ha na-eguzo n’elu nkuku anọ nke ụwa, na-ejidesi ifufe anọ nke ụwa ike, ka ifufe ọ bụla wee ghara ife n’elu ụwa, ma ọ bụ n’elu oké osimiri, ma ọ bụ n’elu osisi ọ bụla.” (Mkpughe 7:1) Gịnị ka nke a pụtaara anyị taa? “Ifufe anọ” ndị a bụ ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ nke ikpe mbibi nke a gaje ịtọhapụ n’oge na-adịghị anya n’isi òtù ụmụ mmadụ na-emebi iwu n’elu ala, ‘n’oké osimiri’ na-amagharị amagharị nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emebi iwu, nakwa n’isi ndị ọchịchị e buliri elu dị ka oké osisi, ndị na-enweta nkwado site n’aka ndị nile bi n’elu ala.—Aịsaịa 57:20; Abụ Ọma 37:35, 36.
4. (a) Gịnị ka ndị mmụọ ozi anọ ahụ nọchiri anya ya? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ọ ga-enwe ná nzukọ elu ala nke Setan mgbe a tọhapụrụ ifufe anọ ahụ?
4 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mmụọ ozi anọ ndị a nọchiri anya òtù ndị mmụọ ozi, ndị Jehova ji eme ihe n’ijighachi mmezu nke ihe o kpere n’ikpe azụ ruo mgbe oge a kara aka maka ya ruru. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ikuku ndị ahụ nke iwe Chineke ifekwasị ụwa n’otu mgbe site n’ugwu, ndịda, ọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, ọ ga-eweta mbibi dị ukwuu. Ọ ga-eyi, kama ọ bụ n’ụzọ dị njọ karị, ojiji Jehova jiri ifufe anọ mee ihe n’ịchụsasị ndị Ilam nke oge ochie, na-etisasị ha, na-ekpochapụkwa ha. (Jeremaịa 49:36-38) Ọ ga-abụ oké ifufe hiri nne nke ukwuu nke ga-ebibi ihe karịa “oké ifufe” nke Jehova ji kpochapụ mba Amọn. (Emọs 1:13-15) Ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke nzukọ Setan dị n’elu ala nke ga-enwe ike iguzo n’ụbọchị oké iwe Jehova, mgbe ọ ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta ruo mgbe nile ebighị ebi.—Abụ Ọma 83:15, 18; Aịsaịa 29:5, 6.
5. Olee otú amụma Jeremaịa si enyere anyị aka ịghọta na ikpe Chineke ga-emetụta elu ụwa dum?
5 Ànyị pụrụ ijide n’aka na ikpe Chineke ga-emetụta elu ala dum? Gee ntị ọzọ ka onye amụma ya bụ Jeremaịa na-ekwu okwu: “Lee, ihe ọjọọ na-apụ si n’otu mba jeruo mba ọzọ, a ga-akpọtekwa oké ifufe site ná nsọtụ nile nke ụwa. Ndị Jehova gburu ga-adịzukwa n’ụbọchị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa.” (Jeremaịa 25:32, 33) Ọ bụ n’oge ajọ oké ifufe nke a ka ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa nke a. A ga-eme ka òtù ọchịchị ya nile mee mkpatụ, wee pụọ n’anya. (Mkpughe 6:12-14) Ma ọdịnihu agaghị agba ọchịchịrị nye mmadụ nile. N’ihi nke a, ọ̀ bụ n’ihi olee ndị ka a na-ejighachi ifufe anọ ahụ azụ?
Ịka Ndị Ohu Chineke Akara
6. Ònye gwara ndị mmụọ ozi ahụ ka ha jighachi ifufe anọ ahụ azụ, gịnịkwa ka nke a na-enye ohere ka e mee?
6 Jọn gara n’ihu ịkọwa ụzọ a ga-esi kaa ụfọdụ ndị akara maka nlanarị, na-asị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-esi n’ọwụwa anyanwụ rịgoo, na-enwe akara nke Chineke dị ndụ: o wee were oké olu tiere ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ́ ndị e nyere ha ike imejọ ụwa na oké osimiri, sị, Emejọla ụwa, ma ọ bụ oké osimiri, ma ọ bụ osisi, ruo mgbe anyị ga-akasịwo ndị ohu Chineke anyị akara n’egedege ihu ha.”—Mkpughe 7:2, 3.
7. Ònye n’ezie bụ mmụọ ozi nke ise nke a, ihe àmà dịkwa aṅaa na-enyere anyị aka ịkwado onye ọ bụ?
7 Ọ bụ ezie na a kpọghị aha mmụọ ozi nke ise nke a, ihe àmà nile na-egosi na ọ ghaghị ịbụ Onyenwe anyị Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube. N’ikwekọ n’ọbụbụ Jisọs bụ Onyeisi ndị mmụọ ozi, e gosiri ya ebe a dị ka onye nwere ikike n’ahụ ndị mmụọ ozi ndị ọzọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16; Jud 9) O si n’ebe ọwụwa anyanwụ bilite, dị ka “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa”—Jehova na Kraịst ya—ndị bịara imezu ihe e kpere n’ikpe, dị ka ndị eze bụ Daraịọs na Saịrọs mere mgbe ha weturu Babilọn oge ochie n’ala. (Mkpughe 16:12; Aịsaịa 45:1; Jeremaịa 51:11; Daniel 5:31) Mmụọ ozi nke a yikwara Jisọs n’ihi na e nyere ya ọrụ nke ịka ndị Kraịst e tere mmanụ akara. (Ndị Efesọs 1:13, 14) Ọzọkwa, mgbe a tọhapụrụ ifufe ndị ahụ, ọ bụ Jisọs na-eduru usuu ndị agha nke eluigwe jee n’imezu ihe e kpere n’ikpe megide mba nile. (Mkpughe 19:11-16) N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ọ ga-abụ Jisọs bụ onye nyere iwu ka e cheretụgodị n’ibibi nzukọ elu ala nke Setan ruo mgbe a kara ndị ohu Chineke akara.
-
-
Ịka Israel nke Chineke AkaraMkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
-
-
[Foto dị na peeji nke 114]
-