Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 13. Gịnị bụ ọdịdị nke igurube ndị ahụ?

      13 Lee nnọọ ọdịdị pụrụ iche igurube ndị ahụ nwere! Jọn kọwara ya, sị: “Oyiyi igurube ahụ yiri ịnyịnya e doziworo ije agha; n’isi ha ka ha na-ekpu ihe dị ka okpueze yiri ọlaedo, ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. Ha nwekwara agịrị isi dị ka agịrị isi ndị inyom, ezé ha dịkwa ka ezé ọdụm. Ha nwekwara ihe agha igbochi obi, dị ka ihe agha igbochi obi nke ígwè; mkpatụ nkù ha dịkwa ka mkpatụ nke ụgbọ ala, nke ọtụtụ ịnyịnya na-agba ọsọ ije agha.”—Mkpughe 9:7-9.

  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 15. Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’ihe ndị a nke igurube ndị ahụ nwere (a) ihe mgbochi obi e ji ígwè mee? (b) ihu yiri nke mmadụ? (ch) agịrị isi yiri nke nwanyị? (d) ezé yiri nke ọdụm? (e) ime oké mkpatụ?

      15 N’ọhụụ ahụ, igurube ndị ahụ nwere ihe mgbochi obi e ji ígwè mee, nke sere onyinyo ezi omume a na-apụghị imebi emebi. (Ndị Efesọs 6:14-18) Ha nwekwara ihu yiri nke mmadụ, nke a na-ezo aka n’àgwà nke ịhụnanya, ebe e mere mmadụ n’oyiyi nke Chineke, onye bụ ịhụnanya. (Jenesis 1:26; 1 Jọn 4:16) Agịrị isi ha dị ogologo dị ka nke nwanyị, nke gosipụtara n’ụzọ ziri ezi na ha na-edo onwe ha n’okpuru Eze ha, bụ́ mmụọ ozi nke abyss ahụ. Ezé ha yikwara ezé ọdụm. Ọdụm na-eji ezé ya adọkasị anụ. Malite na 1919 gaa n’ihu, òtù Jọn ahụ enwewokwa ike ọzọ ịnara nri ime mmụọ siri ike, karịsịa, eziokwu ndị ahụ metụtara Alaeze Chineke nke “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta,” bụ́ Jisọs Kraịst na-achị. Dị nnọọ ka ọdụm na-ese onyinyo obi ike, otú ahụ ka ọ dịworo mkpa inwe obi ike dị ukwuu iji nara ozi nke a na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ, iji wepụta ya n’akwụkwọ dị iche iche e bipụtara, ijikwa kesaa ya gburugburu ụwa. Igurube ihe atụ ndị ahụ emewo mkpatụ dị ukwuu, dị ka “mkpatụ nke ụgbọ ala, nke ọtụtụ ịnyịnya na-agba ọsọ ije agha.” N’ịgbaso ihe atụ nke ndị Kraịst narị afọ mbụ, ha ezubeghị ịgbachi nkịtị.—1 Ndị Kọrint 11:7-15; Mkpughe 5:5.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya