-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—2014 | Nọvemba 15
-
-
Ihe e kwuru ná Mkpughe 11:1, 2 gosiri na e nwere ihe jikọrọ ihe ndị a na mgbe a ga-atụ ụlọ nsọ ihe atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Malakaị isi atọ kwukwara na a ga-enyocha ụlọ nsọ ihe atụ ma mee ka ndị Chineke dị ọcha. (Mal. 3:1-4) Olee oge o were iji nyochaa ụlọ nsọ ahụ ma mee ka ọ dị ọcha? Ọ malitere n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919. Ọ bụ otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii ahụ e kwuru okwu ya, ya bụ, ọnwa iri anọ na abụọ nakwa ụbọchị atọ na ọkara ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 11.
-