Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịtụteghachi Ndịàmà Abụọ Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 23. (a) Gịnị mere ndịàmà abụọ ahụ mgbe ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị gasịrị, mmetụta dị aṅaa ka nke a nwekwara n’ahụ ndị iro ha? (b) Olee mgbe Mkpughe 11:11, 12 na amụma Ezikiel banyere Jehova ikusa ume na ndagwurugwu nke ọkpụkpụ kpọrọ nkụ nwere mmezu ha nke oge a?

      23 Ụzọ mgbasa akụkọ ọha sonyeere ndị ụkọchukwu n’ịkọtọ ndị Chineke, otu n’ime akwụkwọ akụkọ ndị ahụ kwuru, sị: “E wetawo akwụkwọ The Finished Mystery ahụ n’ọgwụgwụ ya.” Otú ọ dị, nke a abụghị eziokwu ma ọlị! Ndịàmà abụọ ahụ anọgideghị dị ka ndị nwụrụ anwụ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ụbọchị atọ na nkera otu ụbọchị ahụ gasịrị mmụọ nke ndụ nke si na Chineke pụta wee bata n’ime ha, ha wee guzo n’ụkwụ ha; oké egwu wee dakwasị ndị na-ekiri ha. Ha wee nụ oké olu nke si n’eluigwe daa, ka ọ na-asị ha, Rịgotanụ n’ebe a. Ha wee rịgoruo n’eluigwe n’ime igwe ojii ahụ; ndị iro ha kirikwara ha.” (Mkpughe 11:11, 12) Otú a, ha nwere ahụmahụ yiri nke ọkpụkpụ kpọrọ nkụ ndị dị na ndagwurugwu ahụ ebe Ezikiel jere n’ọhụụ. Jehova kusara ọkpụkpụ kpọrọ nkụ ndị a ume, ha wee dịghachi ndụ ọzọ, wee si otú a na-ese onyinyo mmụghachi nke mba Israel mgbe 70 afọ nke ndọta n’agha na Babilọn gasịrị. (Ezikiel 37:1-14) Amụma abụọ ndị a, nke dị n’Ezikiel na nke dị ná Mkpughe, nwere mmezu oge a nke pụtara ìhè n’afọ 1919, mgbe Jehova weghachiri ndịàmà ya “nwụrụ anwụ” ná ndụ.

  • Ịtụteghachi Ndịàmà Abụọ Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 25. (a) Olee mgbe a gwara ndịàmà abụọ ahụ, sị, “Rịgotanụ n’ebe a,” oleekwa otú nke ahụ si mee? (b) Oké mmetụta dị aṅaa dị egwu ka mweghachi nke ndịàmà abụọ ahụ nwere n’obodo ukwu ahụ?

      25 Krisendọm gbalịrị ọtụtụ ugbo inweghachi ụdị mmeri ahụ ha nwere na 1918 ọzọ. Ọ malitere iji ọha mmadụ na-emeso ha ihe ike, aghụghọ usoro ikpe ikpe, ịtụ mkpọrọ, ọbụna ogbugbu ihu ọha—ma ọ dịghị nke ọ bụla nwere isi! Mgbe 1919 gasịrị, aka ya apụghị irukwa ọnọdụ ime mmụọ nke ndịàmà abụọ ahụ. N’afọ ahụ, Jehova agwawo ha, sị: “Rịgotanụ n’ebe a,” ha rịgokwara gaa n’ọnọdụ ime mmụọ ka elu ebe ndị iro ha pụrụ nanị ịhụ ha anya, ma ha apụghị ibitụ ha aka. Jọn kọwara oké mmetụta mweghachi ha nwere n’ahụ obodo ukwu ahụ, sị: “N’otu oge hour ahụ oké ala ọma jijiji wee daa, otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ahụ wee daa ruo ala; e wee gbuo [puku mmadụ asaa] n’ime ala ọma jijiji ahụ, bụ ndị nwere aha: ndị fọdụrụ wee tụọ egwu, ha wee nye Chineke nke eluigwe otuto.” (Mkpughe 11:13) N’ezie, e nwere oké ọgba aghara n’okpukpe. O yiri ka è nwere ala ọma jijiji n’okpuru ndị ndú nke chọọchị ndị bụ isi ka ìgwè nke ndị Kraịst a nke a tụteghachiri malitere ọrụ. Nke a nwere oké mmetụta n’ahụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke obodo ha, nke bụ n’ụzọ ihe atụ 7,000 mmadụ, ruo n’ókè na e kwuru okwu ha dị ka ndị e gburu egbu.

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya