-
Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, hà bụ ole ndị?
Ndị mmụọ ozi ụfọdụ nupụụrụ Jehova isi. Onye nke mbụ n’ime ha bụ “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa niile.” (Mkpughe 12:9) Setan chọrọ ka ọ bụrụ ya ga na-achị ndị ọzọ, n’ihi ya, o mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, mechaakwa mee ka ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nupụrụ Chineke isi. A na-akpọ ndị mmụọ ozi ahụ ndị mmụọ ọjọọ. Jehova si n’eluigwe chụdata ha n’ụwa. A ga-emechakwa bibie ha.—Gụọ Mkpughe 12:9, 12.
3. Olee otú Setan na ndị mmụọ ọjọọ si anwa iduhie anyị?
Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-eji mgbaasị eduhie ndị mmadụ. Mgbaasị bụ mmadụ ịgba mbọ ka ya na ndị mmụọ ọjọọ na-ekwurịta okwu. Omume a jọgburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-aga ajụ ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu na ndị dibịa afa ase. Ndị ọzọ na-agakwuru ndị mmụọ ọjọọ ka ha gwọọ ha ọrịa. Ekwensu na-eduhie ndị mmadụ ha echee na ha nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu. Ma, Jehova dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu agakwurula ndị na-agba afa. Unu ajụkwala ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase.” (Levitikọs 19:31) Ọ gwara anyị ihe a ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghara inweta anyị. Ha bụ ndị iro Chineke. Mkpa ha bụkwa imesi anyị ike.
-
-
Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu ANa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Olee ihe ndị na-emegasị n’ụwa kemgbe afọ 1914? Oleekwa otú ndị mmadụ si akpa àgwà kemgbe ahụ?
Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe àmà nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ oge a?’ (Matiu 24:3) Mgbe Jizọs na-aza ha ajụjụ a, o kwuru ọtụtụ ihe ga na-eme ma ya malitechaa ịchị n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Ụfọdụ n’ime ha bụ agha, ụkọ nri, na ala ọma jijiji. (Gụọ Matiu 24:7.) Baịbụl kwukwara na otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà ‘n’oge ikpeazụ’ ga-eme ka ibi ndụ ‘taa akpụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Ihe ndị ahụ a ga-eji mara oge ikpeazụ na-eme aghara aghara kemgbe afọ 1914. Ndị mmadụ na-akpakwa àgwà ndị ahụ Baịbụl kwuru a ga-eji mara mgbe ikpeazụ kemgbe afọ 1914 karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
3. Olee ihe mere ihe ji ka njọ kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị?
Obere oge Jizọs ghọchara Eze Alaeze Chineke, ọ lụsoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ agha n’eluigwe. O meriri Setan n’agha ahụ. Baịbụl kwuru na “a chụdatara [Setan] na ndị mmụọ ozi ya” n’ụwa. (Mkpughe 12:9, 10, 12) Ezigbo iwe na-ewe Setan n’ihi na ọ ma na a ga-ebibi ya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ihe isi ike na ahụhụ jupụta ụwa. Ihe a ga-enyere anyị aka ịma ihe mere ụwa ji bụrụ chi bọọ, a nụ ọzọ. Ma, Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu a niile.
-
-
Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu ANa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
5. Ụwa agbanweela kemgbe afọ 1914
Jizọs buru amụma otú ụwa ga-adị ma ya ghọchaa Eze. Gụọnụ Luk 21:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee nke ị na-ahụ ma ọ bụ nke ị na-anụ gbasara ya n’ime ihe a niile anyị gụpụtara na Baịbụl?
Pọl onyeozi kwuru otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà n’oge ọgwụgwụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ. Gụọnụ 2 Timoti 3:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee àgwà nke ị na-ahụ ndị mmadụ na-akpa n’ime àgwà ndị a?
-