-
Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?
Ihe Baịbụl kwuru
Anụ ọhịa nwere isi asaa e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị niile e nwere n’ụwa.
-
-
Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
O si “n’oké osimiri” pụta. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ jụrụ ife Chineke ka ọchịchị ụmụ mmadụ si n’aka. Ha na-akpa aghara ka ebe osimiri na-amali elu.—Mkpughe 13:1; Aịzaya 17:12, 13.
-
-
Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
“Mpi iri na isi asaa”
Ọnụ ọgụgụ ụfọdụ e dere na Baịbụl nwere ihe ndị ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, asaa na iri pụtara ihe zuru ezu. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe “mpi iri na isi asaa” nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 pụtara? Ọ bụ ihe Baịbụl mechara kwuo gbasara “onyinyo nke anụ ọhịa ahụ.” O kwuru na ọ bụ anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri. (Mkpughe 13:1, 14, 15; 17:3) Baịbụl kwuru na isi asaa nke anụ ọhịa a na-acha uhie uhie pụtara “ndị eze asaa,” ma ọ bụ ọchịchị dị iche iche.—Mkpughe 17:9, 10.
N’ihi ya, isi asaa nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị asaa a ma ama chịrị ụwa, ndị kachakwa kpagbuo ndị Chineke. Ha bụ Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, Rom, nakwa Briten na Amerịka. Ebe ọ bụ na mpi iri ahụ nọchiri anya mba niile na-achị onwe ha, ma ndị ukwu ma ndị nta, ihe ọ pụtara bụ na okpueze nke dị na mpi nke ọ bụla na-egosi na ọ bụ n’otu oge ahụ ọchịchị ndị ahụ a ma ama na-achị ụwa na-achị ka mba ndị ahụ na-achị onwe ha na-achịkwa.
-
-
Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
Akwụkwọ ikpeazụ na Baịbụl kwuru na akara 666 bụ nọmba ma ọ bụ aha otu anụ ọhịa nwere isi asaa na mpi iri nke si n’oké osimiri pụta. (Mkpughe 13:1, 17, 18) Anụ ọhịa a nọchịrị anya ọchịchị niile dị n’ụwa, bụ́kwa nke na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” (Mkpughe 13:7) Akara ahụ bụ 666 gosiri na ọchịchị ụwa a kụrụ afọ n’ala kpamkpam n’anya Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?
-