Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ikpe Ajọ Nwanyị ahụ Na-akwa Iko Ikpe
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 13. Olee ihe dị ịtụnanya nke Jọn hụrụ mgbe mmụọ ozi ahụ buuru ya n’ike nke mmụọ nsọ banye n’ọhịa?

      13 Gịnị ọzọ ka amụma ahụ na-ekpughe banyere oké akwụna ahụ na ihe ga-eme ya? Dị ka Jọn na-akọ ugbu a, a hụrụ ihe nkiri ọzọ gbara ọkpụrụkpụ: “O [mmụọ ozi ahụ] wee bupụ m baa n’ọhịa n’ime mmụọ nsọ: m wee hụ nwanyị ka ọ na-anọkwasị n’anụ ọhịa na-acha uhie uhie, nke nwere aha dị iche iche jupụtara ná nkwulu Chineke, nweekwa isi asaa na mpi iri.”—Mkpughe 17:3.

  • Ikpe Ajọ Nwanyị ahụ Na-akwa Iko Ikpe
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 15. Ọdịiche dị aṅaa ka e nwere n’etiti anụ ọhịa nke Mkpughe 13:1 na nke ahụ dị ná Mkpughe 17:3?

      15 Anụ ọhịa nke a nwere isi asaa na mpi iri. N’ihi nke a, ya na anụ ọhịa ahụ nke Jọn hụrụ na mbụ ọ̀ bụ otu ihe ahụ, bụ́ nke nwekwara isi asaa na mpi iri? (Mkpughe 13:1) Ee e, e nwere ihe ndị dị iche. Anụ ọhịa nke a na-acha uhie uhie, n’eyighịkwa anụ ọhịa nke mbụ ahụ, e kwughị na o nwere okpueze dị iche iche. Kama inwe aha ndị jupụtara ná nkwulu Chineke nanị n’isi asaa ya, o “nwere aha dị iche iche jupụtara ná nkwulu Chineke.” Ma, a ghaghị inwe njikọ n’etiti anụ ọhịa ọhụrụ nke a na nke mbụ ahụ; myirịta dị n’etiti ha dị ukwuu nke na ọ gaghị abụ ihe ndabara nkịtị.

      16. Gịnị bụ anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, gịnịkwa ka e kwuworo banyere nzube ya?

      16 N’ihi ya, gịnị bụ anụ ọhịa ọhụrụ nke a na-acha uhie uhie? Ọ ghaghị ịbụ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ, nke e guzobere site ná nkwado nke anụ ọhịa Anglo-America ahụ nke nwere mpi abụọ yiri nke nwa atụrụ. Mgbe e mesịrị ihe oyiyi ahụ, e kwere ka anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ nye ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ ume ndụ. (Mkpughe 13:14, 15) Ugbu a, Jọn na-ahụ anụ ọhịa ahụ nke dị ndụ, na-ekukwa ume. O sere onyinyo òtù League of Nations nke anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ guzobere n’afọ 1920. President Wilson nke mba U.S. nwere olileanya na òtù League ahụ “ga-abụ ebe a ga-anọ na-ahụ na mmadụ nile nwetara ikpe ziri ezi, hichapụkwa ihe iyi egwu nke agha ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe a kpọliteghachiri ya n’ọnwụ n’oge a lụsịrị agha ụwa nke abụọ dị ka òtù United Nations, nzube ya e dere ede bụ “ijigide udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile.”

Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya