Tuzdee, Septemba 1
Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike.—2 Kọr. 13:5.
Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ọ bụghị naanị ka anyị tozuo etozuo, kamakwa ka anyị bụrụ ndị tozuru etozu na-aga. Ọ pụtara na anyị ekwesịghị iche na anyị amarachaala ihe niile. (1 Kọr. 10:12) Anyị kwesịrị ‘ịna-enyocha’ onwe anyị ka anyị jide n’aka na anyị na-emekwu nke ọma. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Kọlọsi, o kwukwara na ha ekwesịghị ịkwụsị ịbụ ndị tozuru etozu. N’agbanyeghị na ha bụ Ndị Kraịst tozuru etozu, Pọl dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ikwe ka e jiri echiche ụwa duhie ha. (Kọl. 2:6-10) Ọ ga-abụ na Epafras ma ndị nọ n’ọgbakọ Kọlọsi nke ọma. N’ihi ya, o kpere ekpere mgbe niile ka ha “kwụrụ chịm n’ikpeazụ ka ndị tozuru etozu.” (Kọl. 4:12) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ihe anyị na-amụta bụ na Pọl na Epafras ghọtara na ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwụsị ịbụ ndị tozuru etozu, anyị ga-achọ ka Chineke nyere anyị aka, anyị ana-agbalịsikwa ike ka anyị na ya na-adịkwu ná mma. Ha chọrọ ka ụmụnna nọ na Kọlọsi bụrụ ndị tozuru etozu mgbe niile, ya bụ, Ndị Kraịst bụ́ dimkpa n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. w24.04 6 ¶16-17
Wenezdee, Septemba 2
Jehova nọnyeere anyị. Unu atụla ha egwu.—Ọnụ Ọgụ. 14:9.
Ọ bụrụ na anyị amụta ịtụ egwu Jehova otú kwesịrị ekwesị, anyị ga-ahụ ya n’anya nke na anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe. Ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịmata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ, na ihe dị iche n’eziokwu na ụgha, ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Jehova mma. (Ilu 2:3-6; Hib. 5:14) Ọ bụrụ na anyị atụọ egwu mmadụ karịa otú anyị si atụ egwu Jehova, o nwere ike ime ka anyị hapụ eziokwu Jehova na-akụziri anyị. Ka anyị lee ihe ndị isi iri na abụọ ndị gara inyopụta ala Jehova kwere ụmụ Izrel ná nkwa mere. Mmadụ iri n’ime ha kwere ka egwu ha na-atụ ndị Kenan karịa otú ha si hụ Jehova n’anya. Ha gwara ndị Izrel ibe ha, sị: “Anyị agaghị alụsoli ndị obodo ahụ agha n’ihi na ha ka anyị ike.” (Ọnụ Ọgụ. 13:27-31) N’anya mmadụ, ndị Kenan siri ike karịa ndị Izrel. O doro ewu na ọkụkọ anya. Mana, mmadụ ikwu na ndị Izrel agaghị enwe ike imeri ndị iro ha gosiri na o nweghị okwukwe na Jehova. w24.07 9 ¶5-6
Tọzdee, Septemba 3
Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?—Jen. 18:25.
Obi ò kwesịrị isi anyị ike na mgbe ọ bụla Jehova kpere ndị mmadụ ikpe, na ikpe ya na-abụ ikpe ziri ezi? Ee. Ebreham ghọtara nke ọma na Jehova bụ “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe,” onye zuru okè, onye kacha nwee amamihe, nakwa onye na-eme ebere. Ọ zụọla Ọkpara ya ikpe ikpe, nyefeekwa ya ọrụ ikpe mmadụ niile ikpe. (Jọn 5:22) Ma Jizọs ma Nna ya nwere ike ịmata ihe dị onye ọ bụla n’obi. (Mat. 9:4) N’ihi ya, ha kpewe onye nke ọ bụla ikpe, ha ga-eme “ihe dị mma.” Ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova na ihe ndị o kpebiri obi. Anyị ma na anyị erughị eru ikpe ikpe. Ma, Jehova ruru eru ikpe ikpe. (Aịza. 55:8, 9) N’ihi ya, obi na-esi anyị ike ịhapụrụ ya na Ọkpara ya ikpe niile. Anyị makwa na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ebere ka Nna ya.—Aịza. 11:3, 4. w24.05 7 ¶18-19