Ezra
8 Ndị a bụ ndị isi nke ọnụmara+ ha nakwa aha ndị mụ na ha so lawa mgbe Atazaksis+ eze Babịlọn na-achị, dị ka usoro ọmụmụ ha si dị:+ 2 N’ime ụmụ Finihas,+ Geshọm; n’ime ụmụ Ịtama,+ Daniel;+ n’ime ụmụ Devid,+ Hatọsh; 3 n’ime ụmụ Shekanaya, bụ́ ụmụ Perọsh,+ Zekaraya, na otu narị ndị ikom na iri ise e debara aha ha n’akwụkwọ; 4 n’ime ụmụ Pehat-moab,+ Elaịho-inaị nwa Zerahaya, na narị ndị ikom abụọ; 5 n’ime ụmụ Zatu,+ Shekanaya nwa Jahazayel, na narị ndị ikom atọ; 6 n’ime ụmụ Edin,+ Ibed nwa Jọnatan, na iri ndị ikom ise; 7 n’ime ụmụ Ilam,+ Jesheya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa; 8 n’ime ụmụ Shefataya,+ Zebadaya nwa Maịkel, na iri ndị ikom asatọ; 9 n’ime ụmụ Joab, Obadaya nwa Jehayel, na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ; 10 n’ime ụmụ Benaị,+ Shelomit nwa Josifaya, na otu narị ndị ikom na iri isii; 11 n’ime ụmụ Bibaị, Zekaraya nwa Bibaị,+ na iri ndị ikom abụọ na asatọ; 12 n’ime ụmụ Azgad,+ Johenan nwa Hakatan, na otu narị ndị ikom na iri; 13 n’ime ụmụ Adọnaịkam,+ ndị bụ́ ndị ikpeazụ, ndị a bụkwa aha ha: Elifelet, Jeayel na Shemaya, na ndị ikom iri isii; 14 n’ime ụmụ Bigvaị,+ Yutaị na Zabọd, na ndị ikom iri asaa.
15 M wee kpọkọta ha n’akụkụ osimiri+ nke na-asọba n’Aheva;+ anyị wee maa ụlọikwuu n’ebe ahụ ruo ụbọchị atọ, ka m wee leruo ìgwè mmadụ ahụ anya nke ọma,+ tinyere ndị nchụàjà,+ ma ọ dịghị otu n’ime ụmụ Livaị+ m hụrụ n’ebe ahụ. 16 M wee zie ozi ka a kpọọ Elịiza, Ariel, Shemaya na Elnetan na Jerib na Elnetan na Netan na Zekaraya na Meshọlam, bụ́ ndị isi, nakwa Joyarib na Elnetan, ndị na-ezi ihe.+ 17 M wee nye ha iwu banyere Ido bụ́ onyeisi n’ebe a na-akpọ Kasifaya, m wee gwa ha ihe ha+ ga-agwa Ido na ụmụnne ya, bụ́ ndị Netinim,+ n’ebe a na-akpọ Kasifaya, ka ha kpọtara anyị ndị ga na-eje ozi+ n’ụlọ Chineke anyị. 18 Ha wee kpọtara anyị nwoke nwere ezi uche+ nke bụ́ otu n’ime ụmụ Malaị+ bụ́ nwa nwa Livaị+ nwa Izrel, ya bụ, Sherebaya+ na ụmụ ya na ụmụnne ya, mmadụ iri na asatọ, n’ihi na aka+ Chineke anyị dị mma n’ahụ́ anyị; 19 tinyere Hashabaya na Jesheya bụ́ ụmụ Meraraị,+ ụmụnne ya, nakwa ụmụ ha, mmadụ iri abụọ. 20 N’ime ndị Netinim, bụ́ ndị Devid na ndị isi nyere ka ha na-ejere ndị Livaị ozi, narị ndị Netinim abụọ na iri abụọ, bụ́ ndị a kpọrọ aha ha n’otu n’otu.
21 M wee kwuo ka e buo ọnụ n’ebe ahụ n’osimiri Aheva, ka anyị wee weda onwe anyị ala+ n’ihu Chineke anyị, iji rịọ ya ka o zi anyị ụzọ dị mma+ maka anyị na ụmụaka anyị+ na ngwongwo anyị niile. 22 N’ihi na ihere mere m ịrịọ eze ka o nye anyị ndị agha+ na ndị na-agba ịnyịnya+ iji nyere anyị aka ibuso ndị iro agha n’ụzọ, n’ihi na anyị gwara eze, sị: “Aka+ Chineke anyị na-echebe ndị niile na-achọ ya imere ha ihe ọma,+ ma ike ya na iwe+ ya na-emegide ndị niile na-ahapụ ya.”+ 23 N’ihi ya, anyị buru ọnụ,+ rịọkwa Chineke anyị arịrịọ+ banyere nke a, o wee nabata arịrịọ anyị rịọrọ+ ya.
24 M wee si n’etiti ndị isi ndị nchụàjà kpọpụta mmadụ iri na abụọ, ya bụ, Sherebaya,+ Hashabaya,+ na mmadụ iri n’ime ụmụnne ha. 25 M wee tụọ ọlaọcha na ọlaedo na arịa dị iche iche+ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bunye ha, tinyere onyinye e nyere maka ụlọ Chineke anyị bụ́ nke eze+ na ndị ndụmọdụ+ ya na ndị o mere ndị isi na ụmụ Izrel+ niile nọ n’ógbè ahụ nyere. 26 M wee tụọ narị talent ọlaọcha+ isii na iri ise n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee bunye ha, tinyere otu narị arịa ọlaọcha dị talent abụọ, na ọlaedo dị otu narị talent, 27 na obere ọkwá ọlaedo iri abụọ ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku mkpụrụ ego darik na arịa abụọ e ji ezigbo ọla kọpa mee, nke na-acha ọbara ọbara, nke a na-achọsi ike dị ka ọlaedo.
28 M wee sị ha: “Unu bụ ihe dị nsọ+ nye Jehova, arịa+ ndị a bụkwa ihe dị nsọ, ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụ onyinye afọ ofufo e nyere Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna unu. 29 Lezienụ anya, cheekwanụ ha nche ruo mgbe unu tụrụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀+ bunye ndị isi ndị nchụàjà na ndị Livaị na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’Izrel, bụ́ ndị nọ na Jeruselem, n’ebe iri ihe+ nke dị n’ụlọ Jehova.” 30 Ndị nchụàjà na ndị Livaị wee nata ọlaọcha na ọlaedo na arịa ndị ahụ a tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, iji bute ha na Jeruselem n’ụlọ Chineke anyị.+
31 N’ikpeazụ, anyị si n’osimiri Aheva+ kwalie n’abalị iri na abụọ n’ọnwa+ nke mbụ wee lawa Jeruselem, aka Chineke anyị chebere anyị, o wee napụta+ anyị n’aka ndị iro na ndị chechiri anyị n’ụzọ. 32 Anyị wee rute Jeruselem+ nọrọ n’ebe ahụ ụbọchị atọ. 33 N’ụbọchị nke anọ, anyị tụrụ ọlaọcha na ọlaedo+ na arịa+ ndị dị n’ụlọ Chineke anyị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee nyefee ha n’aka Meremọt+ nwa Yuraịja onye nchụàjà, ya na Elieza nwa Finihas, ha na Jozabad+ nwa Jeshụa na Noadaya nwa Binuaị+ bụ́ ndị Livaị, 34 a gụrụ ihe niile ọnụ, tụọkwa ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, e mesịa, e dere ịdị arọ ha niile n’akwụkwọ n’oge ahụ. 35 Ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na-alọta, ndị bụbu ndị a dọọrọ n’agha,+ chụụrụ Chineke Izrel àjà+ nsure ọkụ, ya bụ, oké ehi+ iri na abụọ maka Izrel dum, ebule+ iri itoolu na isii, ụmụ ebule iri asaa na asaa, mkpi+ iri na abụọ, ka ọ bụrụ àjà mmehie, ha niile bụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova.
36 Anyị wee nyefee ndị setrap+ eze na ndị gọvanọ+ nọ n’ofe Osimiri+ iwu+ eze nyere, ha wee kwado ndị anyị+ na ụlọ ezi Chineke.