Abụ. Abụ olu ụtọ Esaf.+
83 Chineke, biko, agbala nkịtị;+
Emechila ọnụ, anọla jụụ, gị Chineke.+
2 N’ihi na, lee! ndị iro gị nọ n’ọgba aghara;+
Ndị kpọrọ gị asị nke ukwuu eweliwo isi ha elu.+
3 Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu;+
Ha na-agbakwara ndị gị e zobere ezobe izu.+
4 Ha asịwo: “Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba,+
Ka a gharakwa icheta aha Izrel ọzọ.”+
5 N’ihi na ha ejiriwo otu obi gbaa izu;+
Ha wee gbaa ndụ imegide gị,+
6 Ụlọikwuu Idọm+ na ndị Ishmel, Moab+ na ndị Hega,+
7 Gibal na Amọn+ na Amalek,
Filistia+ tinyere ndị bi na Taya.+
8 Asiria esonyewokwara ha;+
Ha aghọworo ụmụ Lọt ogwe aka.+ Sila.
9 Mee ha ihe i mere Midian,+ ihe i mere Sisera,+
Ihe i mere Jebin+ n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn.+
10 A lara ha n’iyi n’En-dọọ;+
Ha ghọrọ nri ala.+
11 Mee ndị ha a ma ama ihe i mere Oreb na Zieb,+
Meekwa ndị isi ha niile ihe i mere Ziba na Zalmọna,+
12 Bụ́ ndị sịrị: “Ka anyị weghara ebe obibi Chineke.”+
13 Chineke m, biko, mee ka ha dị ka ogwu nke ifufe bu na-agba gburugburu,+
Dị ka ahịhịa nke ifufe na-ebugharị.+
14 Dị ka ọkụ nke na-agba oké ọhịa+
Nakwa dị ka ire ọkụ nke na-ere ugwu,+
15 Si otú ahụ jiri oké ifufe chụọ ha ọsọ,+
Jirikwa ifufe mmiri gị kowe ha obi n’elu.+
16 Jehova, biko, mee ka ihere ju ha ihu,+
Ka ndị mmadụ wee chọọ aha gị.+
17 Biko, ka ihere mee ha, ka obi gharakwa iru ha ala mgbe ọ bụla,+
Ka e mechuo ha ihu, ka ha laakwa n’iyi;+
18 Ka ndị mmadụ wee mara+ na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova,+
Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu+ n’ụwa niile.+