Aịzaya
9 Otú ọ dị, oké ọchịchịrị ahụ agaghị agbachi otú ọ gbachiri mgbe ala a nwere nsogbu, n’oge mbụ mgbe e lelịrị ala Zebulọn na ala Naftalaị+ nakwa mgbe e mesịrị mee ka ọ bụrụ nke a na-asọpụrụ+—ụzọ nke dị n’akụkụ oké osimiri, n’ógbè Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ+. 2 Ndị na-eje ije n’ọchịchịrị ahụwo oké ìhè.+ Ìhè enwukwasịwo+ ndị bi n’ala nke oké ọchịchịrị.+ 3 I mewo ka mba a nwee ụba mmadụ;+ i mewo ka ọ na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+ Ha aṅụrịwo ọṅụ n’ihu gị dị ka ọṅụ a na-aṅụrị n’oge owuwe ihe ubi,+ dị ka ndị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha na-eke ihe ha kwatara n’agha.+
4 N’ihi na, dị ka i mere n’ụbọchị Midian,+ ị kụjisịwo yok ha ji ebu ibu+ na mkpanaka nke dị n’ubu ha, bụ́ mkpara nke onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.+ 5 N’ihi na akpụkpọ ụkwụ niile nke onye na-azọ ụkwụ n’ala+ n’ụzọ na-akpata ịma jijiji nakwa ákwà mgbokwasị a gwọtọrọ n’ọbara aghọwo ọbụna ihe a ga-erechapụ n’ọkụ dị ka nkụ.+ 6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+ 7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
8 Ọ dị okwu Jehova kwuru megide Jekọb, o wee bịakwasị Izrel.+ 9 Ha ga-anụ ya,+ ọbụna ha niile, Ifrem na ndị bi na Sameria,+ n’ihi mpako ha nakwa n’ihi obi nganga ha nke ha ji sị:+ 10 “Ọ bụ ụlọ brik dara, ma, ọ bụ nkume a wara awa+ ka anyị ga-eji wuo ya. Ọ bụ osisi sịkamọ+ ka e gbuturu, ma, ọ bụ osisi sida ka anyị ga-eji dochie ya.” 11 Jehova ga-emekwa ka ndị na-emegide Rizin dị elu megide ya, ọ ga-akpali ndị iro ya,+ 12 Siria ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ ndị Filistia ga-esikwa n’azụ,+ ha ga-emeghe ọnụ ripịa Izrel.+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+
13 Ha alaghachikwurughị Onye na-eti ha ihe,+ ha achọghịkwa Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ 14 Jehova ga-ebepụkwa isi+ na ọdụdụ,+ ome na ahịhịa amị n’Izrel, n’otu ụbọchị.+ 15 Ọ bụ agadi nke a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu bụ isi,+ ọ bụkwa onye amụma nke na-enye ntụziaka ụgha bụ ọdụdụ.+ 16 Ọ bụ ndị na-edu ndị a na-eme ka ha kpafuo;+ ndị a na-edukwa edu n’ime ha bụ ndị a na-emegharị anya.+ 17 Ọ bụ ya mere na Jehova agaghị aṅụrị ọṅụ ọbụna n’ihi ụmụ okorobịa ha,+ ọ gaghịkwa emere ụmụ ha na-enweghị nna nakwa ndị inyom ha di ha nwụrụ ebere; n’ihi na ha niile bụ ndị si n’ezi ofufe dapụ+ na ndị na-eme ihe ọjọọ, ọnụ niile na-ekwukwa okwu nzuzu. N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+
18 N’ihi na ajọ omume amalitewo ire dị ka ọkụ;+ ọ ga-erepịa osisi ogwu na ahịhịa.+ Ọ ga-enwuru ọkụ n’alụghụlụ ndị dị n’oké ọhịa,+ ha ga-akwụgo elu otú anwụrụ ọkụ si akwụgo.+ 19 A mụnyewo ala a ọkụ n’ihi oké iwe Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị bi na ya ga-aghọkwa nkụ n’ọkụ ahụ.+ Ọ dịghị onye ga-enwere ọbụna nwanne ya ọmịiko.+ 20 Mmadụ ga-egbutu ihe dị n’aka nri, agụụ ga na-agụkwa ya; mmadụ ga-eri ihe dị n’aka ekpe, afọ agaghịkwa eju ya.+ Onye ọ bụla n’ime ha ga-eri anụ ogwe aka ya,+ 21 Manase ga-eri Ifrem, Ifrem eriekwa Manase. Ha ga-agbakọ aka megide Juda.+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+