Luk
3 N’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd+ abụrụkwa onye na-achị ógbè Galili, ma Filip nwanne ya bụ onye na-achị ógbè Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias abụrụkwa onye na-achị ógbè Abilini, 2 n’ụbọchị onyeisi nchụàjà bụ́ Anas na n’ụbọchị Keyafas,+ okwu Chineke ruru Jọn+ nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.+
3 O wee na-agagharị n’ógbè niile dị gburugburu Jọdan, na-ekwusa baptizim dị ka ihe na-egosi nchegharị bụ́ nke na-eme ka a gbaghara mmehie,+ 4 dị nnọọ ka e dere n’akwụkwọ nke okwu Aịzaya onye amụma, sị: “Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova, meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.+ 5 A ghaghị ikpochi okokoro ọ bụla, kposaakwa ugwu ukwu niile na ugwu nta niile, ebe ndị gbara ngọ aghaghịkwa ịghọ ụzọ ndị kwụ ọtọ, ebe ndị na-adịghị larịị aghọọkwa ụzọ ndị dị larịị;+ 6 anụ ahụ́ niile ga-ahụkwa onye Chineke ga-esi n’aka ya weta nzọpụta.’”+
7 Ya mere, ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim, sị: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ ọnụma ahụ nke na-abịa?+ 8 Ya mere, mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị.+ Unu asịkwala n’ime onwe unu, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike ime ka Ebreham nweta ụmụ site na nkume ndị a. 9 N’ezie, anyụike adịrịwo na mgbọrọgwụ osisi, n’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”+
10 Ìgwè mmadụ ahụ na-ajụkwa ya, sị: “Gịnịzi ka anyị ga-eme?”+ 11 Ọ na-aza ha, sị: “Onye nwere uwe ime abụọ, ya chịnye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu, onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otú ahụ.”+ 12 Ma ọbụna ndị ọnaụtụ bịara ka e mee ha baptizim, ha wee sị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka anyị ga-eme?”+ 13 Ọ sị ha: “Unu anala ihe ọ bụla karịrị ego a na-akwụ n’ụtụ isi.”+ 14 Ndị agha na-ajụkwa ya, sị: “Gịnịkwa ka anyị ga-eme?” Ọ na-asịkwa ha: “Unu awakpola onye ọ bụla ma ọ bụ bo onye ọ bụla ebubo+ ụgha, kama ka ihe a na-enye unu ju unu afọ.”+
15 Ka ndị Juu nọ na-atụ anya, ka mmadụ niile nọkwa na-atụle n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”+ 16 Jọn zara ha niile, sị: “Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim; ma onye ka m ike na-abịa, bụ́ onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+ 17 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka iji debe ebe nzọcha mkpụrụ ya ọcha nke ọma nakwa ka o kpokọba+ ọka wit n’ụlọ nkwakọba ihe ya, ma ọ ga-agba igbogbo+ ya ọkụ n’ọkụ+ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
18 Ya mere, o kwukwara ọtụtụ okwu ndụmọdụ ndị ọzọ ma na-ezisara ndị mmadụ ozi ọma. 19 Ma ebe ọ bụ na Jọn katọrọ Herọd onye na-achị ógbè ahụ n’ihi Herodias bụ́ nwunye nwanne ya nakwa n’ihi ihe ọjọọ niile Herọd mere,+ 20 Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+
21 Ma mgbe a nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, e mekwara Jizọs+ baptizim, ka ọ nọ na-ekpe ekpere, e meghere eluigwe,+ 22 mmụọ nsọ wee bekwasị ya n’ọdịdị nduru, otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”+
23 Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ+ mgbe o bidoro ọrụ ya.+ Ọ bụkwa, dị ka e chere,
nwa Hilaị,
24 nwa Matat,
nwa Livaị,
nwa Melkaị,
nwa Janaị,
nwa Josef,
25 nwa Matatayas,
nwa Emọs,
nwa Nehọm,
nwa Eslaị,
nwa Nagaị,
26 nwa Meyat,
nwa Matatayas,
nwa Semein,
nwa Josek,
nwa Joda,
27 nwa Joanan,
nwa Risa,
nwa Zerọbabel,+
nwa Shieltiel,+
nwa Niraị,
28 nwa Melkaị,
nwa Adaị,
nwa Kosam,
nwa Elmedam,
nwa Ea,
29 nwa Jizọs,
nwa Elịiza,
nwa Jorim,
nwa Matat,
nwa Livaị,
30 nwa Simiọn,
nwa Judas,
nwa Josef,
nwa Jonam,
nwa Elayakim,
31 nwa Milia,
nwa Mena,
nwa Matata,
nwa Netan,+
nwa Devid,+
nwa Obed,+
nwa Boaz,+
nwa Salmọn,+
nwa Nashọn,+
nwa Anaị,+
nwa Hezrọn,+
nwa Pirez,+
nwa Juda,+
nwa Aịzik,+
nwa Ebreham,+
nwa Tira,+
nwa Nehọ,+
nwa Riu,+
nwa Pileg,+
nwa Iba,+
nwa Shila,+
36 nwa Kaịnan,
nwa Apakshad,+
nwa Shem,+
nwa Noa,+
nwa Lemek,+
nwa Inọk,+
nwa Jered,+
nwa Mahalelel,+
nwa Kaịnan,+
nwa Set,+
nwa Adam,+
nwa Chineke.