Luk
4 Jizọs jupụtara na mmụọ nsọ wee si na Jọdan pụọ, mmụọ nsọ wee na-edugharị ya n’ala ịkpa+ 2 ruo ụbọchị iri anọ,+ ka Ekwensu nọ na-anwa+ ya ọnwụnwa. O righịkwa ihe ọ bụla n’ụbọchị ndị ahụ, n’ihi ya, agụụ gụwara ya mgbe ụbọchị ndị ahụ gachara. 3 Ekwensu wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ ogbe achịcha.” 4 Ma Jizọs zara ya, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ.’”+
5 Ya mere, ọ kpọgooro ya n’elu otu ugwu wee gosi ya alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi n’otu ntabi anya; 6 Ekwensu wee sị ya: “M ga-enye gị ikike+ a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya.+ 7 Ya mere, ọ bụrụ na i fee m ofufe,+ ha niile ga-abụ nke gị.” 8 Jizọs zara ya, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova Chineke+ gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’”+
9 O wee duru ya banye Jeruselem ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri na mgbidi+ ụlọ nsọ, wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda;+ 10 n’ihi na e dere, sị, ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichebe gị,’+ 11 nakwa na ‘Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume mgbe ọ bụla.’”+ 12 Jizọs zara ya, sị: “E kwuru, sị, ‘Elela Jehova bụ́ Chineke gị ule.’”+ 13 Ya mere, mgbe Ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ahụ niile, o si n’ebe ọ nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.+
14 Jizọs wee laghachi Galili+ site n’ike mmụọ nsọ. Okwu ọma banyere ya wee gbasaa n’ógbè niile dị gburugburu ebe ahụ.+ 15 Ọ malitekwara izi ihe n’ụlọ nzukọ ha, mmadụ niile na-enyekwa ya nsọpụrụ.+
16 O wee bịa Nazaret,+ bụ́ ebe ọ nọ too; ọ banyere n’ụlọ nzukọ,+ dị ka ọ na-emekarị n’ụbọchị izu ike, o wee guzo ọtọ ka ọ gụọ ihe. 17 E wee nye ya akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaya onye amụma, o meghekwara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma chọta ebe e dere, sị: 18 “Mmụọ Jehova+ dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa,+ 19 ikwusa afọ Jehova na-anabata ndị mmadụ.”+ 20 O wee fụkọta akwụkwọ mpịakọta ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi ma nọdụ ala; ndị niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ wee legidesie ya anya ike. 21 O wee malite ịsị ha: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.”+
22 Ha niile wee malite ịgba àmà dị mma banyere ya, okwu ọma+ ndị si n’ọnụ ya na-apụta tụkwara ha n’anya, ha wee na-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwa Josef?”+ 23 O wee sị ha: “Obi abụọ adịghị ya na unu ga-asị na ihe atụ a metụtara m, ‘Ọgwọ ọrịa,+ gwọọ onwe gị; ihe ndị ahụ+ anyị nụrụ i mere na Kapaniọm,+ mee ha n’ebe a, n’obodo a mụrụ gị.’”+ 24 Ma ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu na ọ dịghị onye amụma a na-anabata n’ebe a mụrụ ya. 25 Dị ka ihe atụ, ana m agwa unu n’eziokwu, N’ụbọchị Ịlaịja, e nwere ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ n’Izrel mgbe e mechiri eluigwe ruo afọ atọ na ọnwa isii, nke mere ka oké ụnwụ dakwasị ala a dum,+ 26 ma e zighị Ịlaịja ka ọ gakwuru nke ọ bụla n’ime ndị inyom ahụ, kama ka ọ gaa naanị Zarefat+ dị n’ala Saịdọn gakwuru otu nwaanyị di ya nwụrụ. 27 E nwekwara ọtụtụ ndị ekpenta n’Izrel n’oge Ịlaịsha onye amụma, ma ọ dịghị otu n’ime ha e mere ka ọ dị ọcha, ma ọ́ bụghị Neaman onye Siria.”+ 28 Iwe wee ju ndị niile na-anụ ihe ndị a n’ụlọ nzukọ ahụ obi;+ 29 ha bilikwara kpụrụ ya gaa n’azụ obodo ahụ ọsọ ọsọ. Ha duuru ya gaa n’ọnụ ọnụ ugwu bụ́ ebe e wuru obodo ha, ka ha wee tụda ya ka o jiri isi daa.+ 30 Ma o si n’etiti ha mịfere gawara onwe ya.+
31 O wee gbadaa Kapaniọm,+ bụ́ obodo dị na Galili. O wee na-ezi ha ihe n’ụbọchị izu ike; 32 otú o si ezi ihe jukwara ha anya,+ n’ihi na o ji ikike na-ekwu okwu.+ 33 Ma n’ime ụlọ nzukọ ahụ, e nwere otu nwoke nke mmụọ ji,+ bụ́ mmụọ ọjọọ na-adịghị ọcha, o wee tie mkpu n’oké olu, sị: 34 “Ewoo! Gịnị jikọrọ anyị na gị,+ Jizọs onye Nazaret?+ Ị̀ bịara ibibi anyị? Amaara m+ kpọmkwem onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”+ 35 Ma Jizọs baara ya mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta.” Ya mere, mgbe ọ tụsịrị nwoke ahụ n’ala n’etiti ha, mmụọ ọjọọ ahụ si n’ime ya pụta n’emerụghị ya ahụ́.+ 36 O wee ju mmadụ niile anya, ha malitekwara ịkparịta ụka, na-asị: “Olee ụdị okwu bụ ihe a, n’ihi na o ji ikike na ike na-enye ndị mmụọ na-adịghị ọcha iwu, ha na-apụtakwa?”+ 37 Ya mere, akụkọ banyere ya nọgidere na-agbasa n’akụkụ ọ bụla nke ógbè dị ebe ahụ gburugburu.+
38 Mgbe o biliri wee si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ Saịmọn. Ma oké ahụ́ ọkụ na-esogbu nne nwunye Saịmọn, ha rịọkwara ya arịrịọ n’ihi nwaanyị ahụ.+ 39 O wee guzoro ya n’akụkụ ma baara ahụ́ ọkụ ahụ mba.+ Ahụ́ ọkụ ahụ wee hapụ ya. O biliri ozugbo ahụ wee malite ijere ha ozi.+
40 Ma mgbe anyanwụ na-ada, ndị niile nwere ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ya. Ọ na-ebikwasị onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’isi wee gwọọ ya.+ 41 Ndị mmụọ ọjọọ na-esikwa n’ime ọtụtụ mmadụ na-apụta,+ na-eti mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara+ Chineke.” Ma, ọ na-abara ha mba, ọ naghịkwa ekwe ka ha kwuo okwu,+ n’ihi na ha maara+ na ọ bụ ya bụ Kraịst.+
42 Otú ọ dị, mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gawa n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.+ Ma ìgwè mmadụ ahụ malitere ịchọgharị ya wee bịarute ebe ọ nọ, ha gbalịkwara igbochi ya ka ọ ghara isi n’ebe ha nọ pụọ. 43 Ma ọ sịrị ha: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”+ 44 N’ihi nke a, ọ gara n’ihu ikwusa Alaeze ahụ n’ụlọ nzukọ ndị dị na Judia.+