2 Ndị Kọrịnt
9 N’ihe banyere ozi+ ahụ a na-ejere ndị nsọ, ọ dịghị mkpa ka m detara unu akwụkwọ, 2 n’ihi na amaara m otú unu si dị njikere n’obi, nke bụ́ ihe m ji na-anyara ndị Masedonia isi banyere unu, na Akeya adịwo njikere ugbu a ruo otu afọ,+ ịnụ ọkụ n’obi unu akpaliwokwa ọtụtụ n’ime ha. 3 Ma m na-ezite ụmụnna ahụ, ka isi anyị ji unu na-anya wee ghara ịbụ n’efu n’ihe a, kama ka unu wee dị njikere n’ezie,+ dị nnọọ ka m na-ekwubu na unu ga-adị. 4 Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ọ bụrụ na ndị Masedonia esoro m bịa ma hụ na unu adịghị njikere n’ụzọ ụfọdụ, ihere ga-eme anyị na unu n’obi ike a anyị nwere. 5 Ya mere, echere m na ọ dị mkpa ịgba ụmụnna ahụ ume ka ha bịakwute unu tupu oge eruo ma kwadebe onyinye unu nke dị ukwuu tupu oge eruo, bụ́ nke unu kwere ná nkwa na mbụ,+ ka nke a wee si otú a bụrụ nke a kwadebere dị ka onyinye dị ukwuu, ọ bụghịkwa dị ka ihe a naara n’ike.+
6 Ma n’ihe a, onye ji aka ntagide na-agha mkpụrụ+ ga-ejikwa aka ntagide ghọrọ mkpụrụ; onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba+ ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba. 7 Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye,+ n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.+
8 Chineke nwekwara ike ime ka obiọma ya dum nke na-erughịrị mmadụ dị ukwuu n’ebe unu nọ, ka unu wee nwee ihe bara ụba maka ezi ọrụ niile,+ ebe unu nwere ihe zuuru unu mgbe niile n’ihe niile. 9 (Dị nnọọ ka e dere, sị: “O kesawo ihe n’ụba, o nyewo ndị ogbenye ihe, ezi omume ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ 10 Ma onye na-enye onye na-agha mkpụrụ mkpụrụ n’ụba, nke na-enyekwa achịcha n’ụba ka ndị mmadụ rie,+ ga-enye mkpụrụ unu na-agha, meekwa ka ọ dị ọtụtụ, ọ ga-emekwa ka ihe ezi omume unu na-arụpụta+ dị ukwuu karị.) 11 N’ihe niile, a na-eme ka unu baa ọgaranya ka unu wee na-emesapụ aka n’ụzọ ọ bụla, bụ́ nke na-eme ka e si n’ọnụ anyị na-enye Chineke ekele;+ 12 n’ihi na ọrụ a nke ijere ọha mmadụ ozi abụghị naanị iji na-enye ndị nsọ+ ihe na-akpa ha n’ụba, kamakwa iji jupụta n’ọtụtụ okwu ekele a na-enye Chineke. 13 N’ihi ihe àmà nke ozi a na-enye, ha na-enye Chineke otuto n’ihi na unu na-erube isi n’ozi ọma banyere Kraịst,+ dị ka unu na-ekwupụta n’ihu ọha na unu na-eme, nakwa n’ihi na unu na-emesapụ aka n’onyinye unu na-enye ha na mmadụ niile;+ 14 sitekwa n’ịrịọsi arịrịọ ike n’ihi unu, agụụ unu na-agụsi ha ike n’ihi oké obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ+ nke dị n’ahụ́ unu.
15 Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.+