2 Ndị Kọrịnt
10 Mụ onwe m, bụ́ Pọl, ji ịdị nwayọọ+ na obiọma+ nke Kraịst na-arịọsi unu arịrịọ ike, ọ bụ ezie na adịghị m ebube n’otú m dị n’elu ahụ́+ mgbe m nọ n’etiti unu, ma mgbe m na-anọghị ya, ana m enwe nkwuwa okwu n’ebe unu nọ.+ 2 N’ezie, ana m arịọ ka m ghara iji nkwuwa okwu na obi ike ahụ mee ihe mgbe m nọ ya, nke m bu n’obi iji mee ụfọdụ ndị ihe n’atụghị egwu,+ bụ́ ndị na-ewere anyị dị ka à ga-asị na anyị na-eje ije dị ka ihe anyị bụ n’anụ ahụ́ si dị. 3 N’ihi na ọ bụ ezie na anyị na-eje ije n’anụ ahụ́,+ anyị adịghị ebu agha dị ka ihe anyị bụ n’anụ ahụ́ si dị.+ 4 N’ihi na ngwá agha anyị ji ebu agha abụghị nke anụ ahụ́,+ kama ọ bụ ihe Chineke mere ka ọ dị ike,+ nke e ji akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike. 5 N’ihi na anyị na-akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke;+ anyị na-emerikwa echiche ọ bụla iji mee ka ọ na-erubere Kraịst isi; 6 anyị dịkwa njikere inye ntaramahụhụ maka nnupụisi ọ bụla,+ ozugbo unu gosiri na unu na-erube isi n’ụzọ zuru ezu.+
7 Unu na-ele ihe anya otú ha dị n’anya.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị onwe ya obi na ya bụ nke Kraịst, ya chebara ihe a echiche ọzọ n’onwe ya, na otú ahụ ọ bụ nke Kraịst, otú ahụ ka anyị bụkwa.+ 8 N’ihi na ọ bụrụgodị na mụ anyaa isi+ gabigatụ ókè maka ikike ahụ Onyenwe anyị nyere anyị iji wulie unu elu, ọ bụghịkwa ịkwada unu,+ a gaghị emenye m ihere, 9 ka o wee ghara ịdị ka m chọrọ iji akwụkwọ ozi m menye unu ụjọ. 10 N’ihi na, ha na-ekwu, sị: “Akwụkwọ ozi ya na-adị arọ, na-adịkwa ike, ma ọnụnọ ya onwe ya adịghị ike,+ okwu ya bụkwa ihe efu.”+ 11 Ka onye dị otú ahụ buru ihe a n’uche, na ihe anyị bụ n’okwu anyị site n’akwụkwọ ozi anyị mgbe anyị na-anọghị ya, ọ bụ ya ka anyị ga-abụkwa n’omume mgbe anyị nọ ya.+ 12 N’ihi na anyị adịghị anwa anwa ekwu na anyị na ndị ụfọdụ hà, ma ọ bụ, jiri onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ bụ́ ndị na-ekwu okwu ọma banyere onwe ha.+ N’ezie, ebe ha ji ụkpụrụ nke aka ha na-atụ onwe ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, jirikwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha enweghị nghọta ọ bụla.+
13 Anyị onwe anyị ga-anya isi, ọ bụghị n’ebe na-abụghị ókèala e kenyere anyị,+ kama dị ka ókèala nke Chineke tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nye anyị si dị, bụ́ nke gụnyere ọbụna ebe unu nọ.+ 14 N’ezie, anyị adịghị agafe ókèala anyị dị ka à ga-asị na ókèala anyị agụnyeghị ebe unu nọ, n’ihi na anyị bụ ndị mbụ bịarutere n’ebe unu nọ ma zisaa ozi ọma banyere Kraịst.+ 15 Ee e, anyị adịghị anya isi n’ebe na-abụghị ókèala e kenyere anyị, n’ebe onye ọzọ dọgburu onwe ya n’ọrụ,+ kama anyị nwere olileanya na, ka a na-eme ka okwukwe unu dị ukwuu karị,+ a pụrụ ime ka anyị dị ukwuu n’etiti unu n’ihe banyere ókèala anyị.+ Mgbe ahụ, anyị ga-adị ukwuu ọbụna karị, 16 izisara obodo ndị dị unu anya ozi ọma,+ ka anyị wee ghara ịnya isi n’ókèala onye ọzọ, bụ́ ebe a maliteworo ọrụ. 17 “Ma onye na-anya isi, ya jiri Jehova nyaa isi.”+ 18 N’ihi na ọ bụghị onye na-ekwu okwu ọma banyere onwe ya ka ihe ya dị Jehova+ mma,+ kama ọ bụ onye Ọ na-ekwu okwu ọma banyere ya.+