Ndị Ikpe
5 N’ụbọchị ahụ, Debora+ na Berak+ nwa Abinoam+ malitere ịbụ abụ,+ sị:
2 “N’ihi ịhapụ ntutu isi ka ọ ghasasịa aghasasịa n’Izrel maka agha,
N’ihi ndị Izrel inye onwe ha n’afọ ofufo,+
Gọzienụ Jehova.+
4 Jehova, mgbe i si na Sia na-apụta,+
Mgbe i si n’ala Idọm zọrọ ije na-apụta,+
Ala mara jijiji,+ mmiri sikwa n’eluigwe zoo,+
Mmiri sikwa n’ígwé ojii zoo.
7 Ndị bi n’obodo a na-agbaghị ogige anọkwaghị, ha anọkwaghị n’Izrel,+
Ruo mgbe mụ onwe m, bụ́ Debora,+ biliri,
Ruo mgbe m biliri dị ka nne n’Izrel.+
Ọ bụ mgbe ahụ ka agha dara n’ọnụ ụzọ ámá.+
A hụghị ọta ma ọ bụ ube
N’etiti puku mmadụ iri anọ n’Izrel.+
9 Obi m dịnyeere ndị ọchịagha Izrel,+
Ndị nyere onwe ha n’afọ ofufo n’etiti ndị Izrel.+
Gọzienụ Jehova.+
10 Unu ndị na-agba nne ịnyịnya ibu na-acha ọbara ọbara,+
Unu ndị na-anọdụ na kapet ọma,
Unu ndị na-eje ije n’okporo ụzọ,
Tụgharịanụ uche!+
11 A na-anụ olu ụfọdụ n’ime ndị na-enye anụmanụ mmiri n’ebe ndị a na-eseta mmiri,+
N’ebe ahụ ka ha malitere ịkọ ọrụ ezi omume Jehova,+
Ọrụ ezi omume nke ndị ya bi n’obodo a na-agbaghị ogige n’Izrel.
Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Jehova gbadara n’ọnụ ụzọ ámá.
13 Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị lanahụrụnụ gbadakwuuru ndị ukwu;
Ndị Jehova wee gbadakwute m ibuso ndị dike agha.
14 N’Ifrem ka ha si, bụ́ ndị nọ na ndagwurugwu,+
Ndị so gị, Benjamin, n’etiti ndị gị.
Na Mekia+ ka ndị ọchịagha si gbadaa,
Na Zebulọn ka ndị ji ihe odeakwụkwọ ji ede ihe sikwa.+
15 Ndị bụ́ ndị isi n’Ịsaka+ so Debora,
Dị ka Ịsaka mere, otú ahụ ka Berak mekwara.+
E dunyere ya ka o jiri ụkwụ gaa na ndagwurugwu.+
E mere ọtụtụ nchọpụta iji mata ihe ndị nọ n’ógbè niile nke Ruben bu n’obi.+
16 Gịnị mere i ji nọdụ ala n’agbata akpa abụọ a na-ekokwasị n’elu ịnyịnya,
Ịnụrụ ọjà a na-egburu ìgwè atụrụ?+
N’ihi na e mere ọtụtụ nchọpụta iji mata ihe ndị nọ n’ógbè niile nke Ruben bu n’obi.+
17 Gilied nọgidere n’ebe obibi ya n’ofe Jọdan;+
Gịnịkwa mere Dan ka ji nọrọ n’ụgbọ mmiri?+
Asha nọ nkịtị n’ụsọ oké osimiri,
Ọ bụkwa n’ebe ọ na-akwụsị ụgbọ mmiri ya ka o bi.+
19 Ndị eze bịara, ha buru agha;
Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị eze Kenan buru agha+
Na Teanak,+ n’akụkụ mmiri Megido.+
Ha enwetaghị ọlaọcha ọ bụla dị ka uru.+
23 ‘Bụọnụ Mirọz ọnụ,’+ ka mmụọ ozi Jehova kwuru,+
‘Na-abụnụ ndị bi na ya ọnụ mgbe niile,
N’ihi na ha abịaghị nyere Jehova aka,
Ha esoghị ndị dike nyere Jehova aka.’
24 N’ime ndị inyom niile, Jeel+ nwunye Hiba onye Kenaịt+ ga-abụ onye a gọziri agọzi karịsịa,
N’ime ndị inyom bi n’ụlọikwuu, ọ ga-abụ onye a gọziri agọzi karịsịa.+
25 Ọ rịọrọ mmiri, ya enye ya mmiri ara ehi;
O ji nnukwu efere nke ndị ukwu nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.+
26 O wee matịa aka ya were mkpọ́ ụlọikwuu,
Matịakwa aka nri ya were hama nke ndị na-arụsi ọrụ ike.+
O wee kụọ ya Sisera, kpọpuo ya isi,+
O wee kpọwaa ma kpọpuo agba ntị ya.
27 N’agbata ụkwụ ya abụọ ka o ruru ala, ọ dara wee tọgbọrọ n’ala;
N’agbata ụkwụ ya abụọ ka o ruru ala, ka ọ dara;
N’ebe ahụ o ruru ala ka ọ dara bụrụ onye e meriri emeri.+
28 Otu nwaanyị si na windo lepụ anya, na-ele anya ya,
Nne Sisera si na mpio ụlọ na-elepụ anya,+ sị,
‘Gịnị mere ụgbọ ịnyịnya agha ya ji na-egbu oge ịlọta?+
Gịnị mere ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya ji na-egbu oge?’+
30 ‘Ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ịchọpụta, ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ikesa ihe nkwata,+
Nwoke ọ bụla ga-eketa otu akpa nwa, akpa nwa abụọ,+
Sisera ga-eketa ákwà e sijiri esiji ndị a kwatara akwata, ee, ákwà e sijiri esiji ndị a kwatara akwata,
Otu uwe a kpara ihe, otu ákwà e sijiri esiji, uwe abụọ a kpara ihe
Ka a ga-eji chọọ olu ndị kwatara ihe mma?’
31 Jehova, ka ndị iro gị niile si otú a laa n’iyi,+
Ka ndị hụrụ gị n’anya+ dịrị ka mgbe anyanwụ ji ike ya dum na-awa.”+
Ala ahụ enwekwaghị nsogbu ọzọ ruo afọ iri anọ.+