Ọpụpụ
11 Jehova wee sị Mosis: “M ga-ata Fero na Ijipt otu ahụhụ ọzọ. E mechaa, ọ ga-ahapụ unu ka unu gawa.+ Mgbe ọ ga-ahapụ unu, ọ ga na-achụ unu achụ ka unu si n’ebe a pụọ.+ 2 Gwa ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile ná ndị m ka ha rịọ ndị agbata obi ha ka ha nye ha ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee.”+ 3 Jehova mekwara ka ihe ndị Izrel masị ndị Ijipt. Ndị na-ejere Fero ozi na ndị Ijipt ndị ọzọ na-akwanyekwara Mosis ezigbo ùgwù n’Ijipt.
4 Mosis wee sị: “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihe dị ka n’etiti abalị, m ga-abanye n’ime Ijipt.+ 5 Nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt ga-anwụ,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke nwaanyị na-eje ozi, bụ́ onye na-egwe ihe na nkume e ji egwe nri, nakwa nwa ọ bụla anụ ụlọ bu ụzọ mụọ.+ 6 N’Ijipt niile, a ga-ebe oké ákwá nke a na-ebetụbeghị ụdị ya, nke a na-agaghịkwa ebe ụdị ya ọzọ.+ 7 Ma, nkịta agaghịdị agbọ ndị Izrel ụja, ma ụmụ nwoke ha ma anụmanụ ha, ka unu wee mara na Jehova nwere ike ime ka e nwee ihe dị iche ná ndị Ijipt na ndị Izrel.’+ 8 Ndị niile na-ejere gị ozi ga-abịakwute m ma kpọọrọ m isiala, sị, ‘Gawa, gị na ndị niile na-eso gị.’+ E mechaa, m ga-agawa.” O wee jiri iwe hapụ Fero pụọ.
9 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Fero agaghị ege unu ntị,+ ka ọrụ ebube m wee dị ọtụtụ n’Ijipt.”+ 10 Mosis na Erọn rụrụ ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero.+ Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, nke mere na ọ hapụghị ndị Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+