8 Ka oge na-aga, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m, dị ka Jehova kwuru, n’Ogige Ndị Nche,+ o wee sị m: “Biko, zụrụ ala m dị n’Anatọt,+ nke dị n’ala Benjamin,+ n’ihi na ọ bụ gị nwe ikike inweta ihe nketa m, ọ bụkwa gị nwe ikike ịgbara ya. Zụrụ ya.” M wee mara na ọ bụ ihe Jehova kwuru.+