Jeremaya
32 Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị n’afọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda,+ ya bụ, afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadreza.+ 2 N’oge ahụ, ndị agha eze Babịlọn nọchibidoro Jeruselem;+ e jikwa Jeremaya onye amụma eji n’Ogige Ndị Nche+ nke dị n’ụlọ eze Juda; 3 n’ihi na Zedekaya eze Juda jichiri ya,+ sị:
“Gịnị mere i ji na-ebu amụma,+ sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn, ọ ga-eweghara ya;+ 4 Zedekaya eze Juda agaghịkwa agbapụ n’aka ndị Kaldia, n’ihi na a ghaghị inyefe ya n’aka eze Babịlọn, ya na ya ga-ekwu okwu ihu na ihu, ya na ya ga-ahụkwa ihu na ihu”’;+ 5 ‘ọ ga-akpụrụ Zedekaya laa Babịlọn, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ọ ga-anọ ruo mgbe m ga-elebara ya anya,’+ ka Jehova kwuru; ‘ọ bụ ezie na unu na-ebuso ndị Kaldia agha, ọ gaghị agaziri unu’?”+
6 Jeremaya wee sị: “Okwu Jehova eruwo m ntị, sị, 7 ‘Lee, Hanamel nwa Shalọm, bụ́ nwanne nna gị ga-abịakwute gị wee sị: “Zụrụ ala m dị n’Anatọt,+ n’ihi na ọ bụ gị nwe ikike ịgbara ya.”’”+
8 Ka oge na-aga, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m, dị ka Jehova kwuru, n’Ogige Ndị Nche,+ o wee sị m: “Biko, zụrụ ala m dị n’Anatọt,+ nke dị n’ala Benjamin,+ n’ihi na ọ bụ gị nwe ikike inweta ihe nketa m, ọ bụkwa gị nwe ikike ịgbara ya. Zụrụ ya.” M wee mara na ọ bụ ihe Jehova kwuru.+
9 M wee zụọ Hanamel+ nwa nwanne nna m ala ahụ dị n’Anatọt.+ M wee tụọ+ ego ma were ya kwụọ ya, ọ dị shekel asaa na mkpụrụ ọlaọcha iri. 10 M wee dee ya n’akwụkwọ nkwekọrịta,+ kaakwa ya akara,+ m kpọkwara ndị akaebe+ mgbe m na-atụ ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.+ 11 E mesịa, m weere akwụkwọ nkwekọrịta ahụ m ji zụọ ya, bụ́ nke ahụ a kara akara dị ka ihe e nyere n’iwu na ụkpụrụ si dị,+ tinyere nke ahụ a na-afụchighị afụchi; 12 m wee nọrọ n’ihu Hanamel nwa nwanne nna m nakwa n’ihu ndị akaebe ahụ, ndị bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ m ji zụọ ala,+ n’ihu ndị Juu niile nọ ọdụ n’Ogige Ndị Nche ahụ,+ nye Barọk+ nwa Neraya+ nwa Masaya akwụkwọ nkwekọrịta ahụ m ji zụọ ya.
13 M wee nye Barọk iwu n’ihu ha, sị: 14 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Were akwụkwọ nkwekọrịta ndị a, akwụkwọ nkwekọrịta nke a m ji zụọ ala ahụ, bụ́ nke a kara akara nakwa akwụkwọ nkwekọrịta nke a na-afụchighị afụchi,+ tinye n’ite ụrọ, ka ha wee dịruo ọtụtụ ụbọchị.’ 15 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘E mesịa, a ga na-azụ ụlọ na ala na ubi vaịn n’ala a.’”+
16 M wee malite ikpeku Jehova ekpere+ mgbe m nyesịrị Barọk+ nwa Neraya+ akwụkwọ nkwekọrịta m ji zụọ ala ahụ, sị: 17 “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova!+ Lee, ọ bụ gị ji ike ukwu gị+ na ogwe aka ị gbatịrị agbatị+ kee eluigwe na ụwa. Ihe a dum anyịghị gị,+ 18 gị Onye na-egosi ọtụtụ puku mmadụ obiọma,*+ onye na-ewere ụgwọ njehie nke ndị bụ́ nna kwụọ ụmụ ha* ndị ga-anọchi ha,+ gị ezi Chineke, Onye ukwu,+ Dike,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha+ bụ aha gị,+ 19 gị onye nzube ya dị ebube+ na onye ọrụ ya dị ukwuu,+ onye ji anya ya ahụ ụzọ niile nke ụmụ mmadụ,+ iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya si dị nakwa dị ka ihe o metara si dị;+ 20 gị onye mere ihe ịrịba ama, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ala Ijipt, bụ́ ndị a maara ruo taa, ma n’Izrel ma n’etiti ndị mmadụ,+ ka i wee meere onwe gị aha, dị ka ọ dị taa.+ 21 I wee jiri ihe ịrịba ama na ọrụ ebube+ na aka dị ike na ogwe aka ị gbatịrị agbatị na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’ala Ijipt+ kpọpụta ndị gị bụ́ Izrel.
22 “Ka oge na-aga, i nyere ha ala a nke ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha,+ bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ 23 Ha wee bata nweta ya,+ ma ha erubeghị isi n’ihe i kwuru, ha ejeghịkwa ije n’iwu gị.+ Ha emeghịkwa ihe niile i nyere ha iwu ka ha mee,+ i wee mee ka ọdachi a dum dakwasị ha.+ 24 Lee! Ndị mmadụ abịawo n’obodo a maa ékpè+ iji weghara ya,+ a ga-enyefekwa obodo a n’aka ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso ya agha,+ n’ihi mma agha+ na ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe;+ ihe i kwuru emewo, gị onwe gị na-ahụkwa ya.+ 25 Ma gị onwe gị, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, asịwo m, ‘Jiri ego zụrụ ala,+ kpọrọkwa ndị akaebe,’+ ọ bụ ezie na a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia.”+
26 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị, sị: 27 “Lee, abụ m Jehova, bụ́ Chineke nke anụ ahụ́ niile.+ Ọ̀ dị ihe ọ bụla nyịrị m?+ 28 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia nakwa n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn, ọ ga-ewegharakwa ya.+ 29 Ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso obodo a agha, ga-abata mụnye obodo a ọkụ wee gbaa ya ọkụ,+ tinyere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha nọ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ, na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ iji kpasuo m iwe.’+
30 “‘N’ihi na ụmụ Izrel na ụmụ Juda na-eme naanị ihe jọrọ njọ n’anya m, malite mgbe ha bụ ụmụaka;+ n’ihi na ụmụ Izrel ji ọrụ aka ha na-akpasu m iwe,’+ ka Jehova kwuru. 31 ‘N’ihi na obodo a na-akpasu m iwe+ na ọnụma malite n’ụbọchị ha wuru ya, ruo taa, bụ́ ihe mere m ga-eji wepụ ya n’ihu m,+ 32 n’ihi ihe ọjọọ niile ụmụ Izrel+ na ụmụ Juda+ mere iji kpasuo m iwe,+ ha na ndị eze ha,+ ndị isi ha,+ ndị nchụàjà ha+ na ndị amụma ha,+ tinyere ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. 33 Ha wee gbakụta m azụ, ha echeghị ihu n’ebe m nọ;+ ọ bụ ezie na m nọ na-ezi ha ihe, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ihe, ma ọ dịghị onye n’ime ha gere ntị wee nara ịdọ aka ná ntị.+ 34 Ha wee debe ihe arụ ha n’ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, ka ha merụọ ya.+ 35 Ha wukwaara Bel ebe dị elu+ na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ iji sureere Molek+ ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ,*+ nke bụ́ ihe m na-enyeghị ha n’iwu,+ ọ bataghịkwa m n’obi ka ha mee ihe arụ a+ wee mee ka Juda mehie.’+
36 “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru banyere obodo a nke unu na-ekwu na a ga-enyefe n’aka eze Babịlọn site ná mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe,+ 37 ‘Lee, m ga-esi n’ala niile m ji iwe na ọnụma na oké iwe+ chụga ha kpọkọta ha; m ga-akpọlata ha n’ebe a, meekwa ka ha biri n’obi iru ala.+ 38 Ha ga-abụ ndị m,+ mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.+ 39 M ga-enye ha otu obi,+ meekwa ka ha mara otu ụzọ, ka ha wee na-atụ egwu m mgbe niile, ka ihe wee dịrị ha na ụmụ ha ndị ga-anọchi ha mma.+ 40 Mụ na ha ga-agba ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ na agaghị m agbakụta ha azụ, ka m wee meere ha ihe ọma;+ m ga-etinyekwa egwu m n’ime obi ha, ka ha ghara ịgbakụta m azụ.+ 41 M ga-enwe aṅụrị n’imere ha ihe ọma,+ m ga-eji obi m dum na mkpụrụ obi m dum kụọ ha n’ala a+ dị ka osisi n’ikwesi ntụkwasị obi.’”
42 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka m meworo ka oké ọdachi a dum dakwasị ndị a, otú ahụ ka m ga-eme ka ihe ọma niile m na-ekwu banyere ha mezuoro ha.+ 43 A ga-azụkwa ala n’ala a+ nke unu ga na-ekwu banyere ya, sị: “Ọ bụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị. E nyefewo ya n’aka ndị Kaldia.”’+
44 “‘Ndị mmadụ ga-eji ego na-azụ ala, a ga na-edekwa akwụkwọ nkwekọrịta,+ na-akakwa ya akara, na-akpọkwa ndị akaebe,+ n’ala Benjamin+ nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu+ nakwa n’obodo ndị dị na Juda+ nakwa n’obodo ndị dị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa n’obodo ndị dị n’ala dị larịị+ nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda,+ n’ihi na m ga-akpọlata ndị ha a dọọrọ n’agha,’+ ka Jehova kwuru.”