Diuterọnọmi 3:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Unu atụkwala ha egwu, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha.’+ Diuterọnọmi 31:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+ Abụ Ọma 20:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ụfọdụ na-ekwu banyere ụgbọ ịnyịnya, ndị ọzọ na-ekwu banyere ịnyịnya,+Ma anyị onwe anyị ga na-ekwu banyere aha Jehova bụ́ Chineke anyị.+ Abụ Ọma 46:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị;+Chineke Jekọb bụụrụ anyị ebe dị elu e wusiri ike.+ Sila. Ilu 21:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ịnyịnya bụ ihe a kwadebere maka ụbọchị agha,+ ma, ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.+ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+
6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+
7 Ụfọdụ na-ekwu banyere ụgbọ ịnyịnya, ndị ọzọ na-ekwu banyere ịnyịnya,+Ma anyị onwe anyị ga na-ekwu banyere aha Jehova bụ́ Chineke anyị.+