Ilu
21 Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova.+ Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.+
2 Ụzọ niile nke mmadụ ziri ezi n’anya ya,+ ma Jehova na-enyocha obi.+
3 Ime ezi omume na ikpe ikpe ziri ezi na-adị Jehova mma karịa àjà.+
4 Anya dị mpako na obi dị nganga,+ ya bụ, oriọna ndị ajọ omume, bụ mmehie.+
5 Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru,+ ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.+
6 Iji ire aghụghọ enweta akụ̀ bụ ume e kupụrụ ekupụ;+ ndị na-eme otú ahụ na-achọ ọnwụ.+
7 Ihe ndị ajọ omume na-ebukọrọ ga-adọkpụrụ ha pụọ,+ n’ihi na ha ajụwo ime ihe n’ikpe ziri ezi.+
8 Mmadụ nke si n’ezi ụzọ dapụ gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya;+ ma onye dị ọcha ziri ezi n’ọrụ ya.+
9 Ọ dị mma mmadụ ibi na nkuku elu ụlọ+ karịa ya na nwaanyị na-ese okwu ibi n’otu ụlọ.+
10 Ihe ọjọọ agụwo mkpụrụ obi onye ajọ omume agụụ;+ mmadụ ibe ya agaghị enweta ihu ọma ọ bụla n’anya ya.+
11 Onye na-amaghị ihe na-aghọ onye maara ihe mgbe e riri onye na-akwa emo iwu;+ onye maara ihe na-enwetakwa ihe ọmụma mgbe e mere ka ọ ghọta ihe.+
12 Onye Ezi Omume na-eleru anya n’ụlọ onye ajọ omume,+ na-akwatu ndị ajọ omume ka ọdachi wee dakwasị ha.+
13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+
14 Onyinye e nyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ;+ ngarị e zobere n’obi uwe+ na-emekwa ka oké ọnụma dajụọ.
15 Ime ihe n’ikpe ziri ezi bụụrụ onye ezi omume ihe ịṅụrị ọṅụ,+ ma ihe egwu dịịrị ndị na-eme ihe ọjọọ.+
16 Mmadụ nke si n’ụzọ nghọta na-akpafu+ ga-ezu ike n’ọgbakọ nke ndị na-adịghị ndụ.+
17 Onye hụrụ oriri na nkwari n’anya ga-ada ogbenye;+ onye hụrụ mmanya na mmanụ n’anya agaghị aba ọgaranya.+
18 Onye ajọ omume bụụrụ onye ezi omume ihe mgbapụta;+ onye na-aghọ aghụghọ bụkwaara ndị ziri ezi ihe mgbapụta.+
19 Ọ dị mma mmadụ ibi n’ala ịkpa karịa ya na nwaanyị na-ese okwu, nke na-akpasukwa mmadụ iwe, ibi.+
20 Akụ̀ a na-achọsi ike na mmanụ dị n’ụlọ onye maara ihe,+ ma onye dị nzuzu ga-eloda ya eloda.+
21 Onye na-achụso ezi omume+ na obiọma* ga-enweta ndụ, ezi omume na nsọpụrụ.+
22 Onye maara ihe arịgorowo ọbụna n’obodo ndị dike, ka o wee kwada ihe na-enye obodo ahụ obi ike.+
23 Onye na-eche ọnụ ya na ire ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya ka ọ ghara ịbanye n’ahụhụ.+
24 Onye na-etu ọnụ, nke dị mpako ma na-anya isi, bụ aha onye ji oké iwe nke mpako na-eme ihe.+
25 Ihe na-agụ onye umengwụ agụụ ga-egbu ya, n’ihi na aka ya ajụwo ịrụ ọrụ.+ 26 Ogologo ụbọchị dum ka agụụ na-agụsi ya ike, ma onye ezi omume na-enye ihe, ọ dịghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+
27 Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ,+ ma ya fọdụzie mgbe mmadụ na-eweta ya ma na-eme omume rụrụ arụ.+
28 Onye akaebe ụgha ga-ala n’iyi,+ ma onye na-aṅa ntị ga na-ekwu okwu ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+
29 Ihere apụwo onye ajọ omume n’ihu,+ ma onye ziri ezi ga-eme ka ụzọ ya guzosie ike.+
30 Ọ dịghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla nke pụrụ iguzogide Jehova.+
31 Ịnyịnya bụ ihe a kwadebere maka ụbọchị agha,+ ma, ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.+