31 N’ihi na ọ bụ okwu Jehova ka o leghaara anya,+ n’ihi na ọ bụkwa ihe o nyere n’iwu ka o mebiri,+ a ghaghị ibipụ+ mkpụrụ obi ahụ. Njehie ya ga-adị ya n’isi.’”+
15 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i geghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’ilezi anya debe iwu ya niile na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa, nkọcha a niile ga-abịakwasị gị ma chụkwute gị:+
14 Ọ bụkwa ya mere m ji ṅụọ iyi megide ụlọ Ilaị na àjà ma ọ bụ onyinye agaghị egbochi ntaramahụhụ a ga-enye maka njehie ụlọ Ilaị ruo mgbe a na-akaghị aka.”+
17 n’ihi na ha ahapụwo m wee gaa na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ka ha wee jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ+ kpasuo m iwe, e mewokwa ka ọnụma m nwuru ọkụ megide ebe a, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’”’+