22 “Ruo ole mgbe ka unu ndị na-amaghị ihe ga na-ahụ amaghị ihe n’anya,+ ruokwa ole mgbe ka ihe doro anya na ọ bụ ịkwa emo ga na-agụ unu ndị na-akwa emo agụụ,+ ruokwa ole mgbe ka unu ndị nzuzu ga na-akpọ ihe ọmụma asị?+
2 Dị nnọọ ka nnụnụ na-enwe ihe mere o ji efepụ, dịkwa nnọọ ka elekentịọba na-enwe ihe mere o ji efe efe, otú ahụ ka nkọcha na-adịghị abịa ma ọ bụrụ na e nweghị ezi ihe kpatara ya.+
20 Akọchala eze+ ọbụna n’ime ụlọ ihi ụra gị, akọchakwala onye ọ bụla bara ọgaranya+ n’ime ime ụlọ gị bụ́ ebe ị na-edina; n’ihi na anụ ufe nke eluigwe ga-eme ka ọ nụ ya, ihe nwere nku ga-akọkwa ya.+