Ilu
26 Dị ka snoo n’oge okpomọkụ, dịkwa ka mmiri ozuzo n’oge owuwe ihe ubi,+ otú ahụ ka nsọpụrụ si bụrụ ihe na-ekwesịghị onye nzuzu.+
2 Dị nnọọ ka nnụnụ na-enwe ihe mere o ji efepụ, dịkwa nnọọ ka elekentịọba na-enwe ihe mere o ji efe efe, otú ahụ ka nkọcha na-adịghị abịa ma ọ bụrụ na e nweghị ezi ihe kpatara ya.+
3 Apịpịa bụ maka ịnyịnya,+ eriri nchịkwa+ bụ maka ịnyịnya ibu, ụtarị bụkwa maka azụ ndị nzuzu.+
4 Azala onye ọ bụla dị nzuzu dị ka nzuzu ya si dị, ka gị na ya ghara ịbụ otu ihe ahụ.+
5 Zaa onye nzuzu dị ka nzuzu ya si dị, ka ọ ghara ịghọ onye maara ihe n’anya onwe ya.+
6 Dị ka onye na-egbubipụ ụkwụ ya, dị ka onye na-aṅụ ime ihe ike dị ka mmiri, otú ahụ ka onye na-etinye okwu n’aka onye nzuzu dị.+
7 Onye ngwọrọ ò jitụla ụkwụ ya gaa seta mmiri? Ọ bụrụ otú ahụ, ndị nzuzu nwere ike ịtụ ilu.+
8 Dị ka onye na-ezobe otu nkume n’ime ikpo nkume, otú ahụ ka onye na-enye onye nzuzu otuto dị.+
9 Dị ka ahịhịa ogwu nke dị n’aka onye aṅụrụma, otú ahụ ka ilu dị n’ọnụ ndị nzuzu.+
10 Dị ka onye na-agba ụta nke na-agbapusi ihe niile, otú ahụ ka onye na-ego onye nzuzu+ ọrụ ma ọ bụ onye na-ego ndị na-agafe agafe ọrụ dị.
11 Dị nnọọ ka nkịta nke na-alaghachi n’agbọ ọ gbọrọ, onye nzuzu na-emeghachi omume nzuzu ya.+
12 Ị̀ hụwo onye maara ihe n’anya onwe ya?+ Olileanya dịịrị onye nzuzu+ karịa ka ọ dịịrị ya.
13 Onye umengwụ asịwo: “Nwa ọdụm nọ n’ụzọ, ọdụm nọ n’etiti ámá obodo.”+
14 Ibo ụzọ na-aga ihu na azụ n’ihe nkonye ya, onye umengwụ na-atụgharịkwa ugboro ugboro n’elu ihe ndina ya.+
15 Onye umengwụ amanyewo aka ya n’ime efere nri; ike adịkwaghị ya iweghachite ya n’ọnụ ya.+
16 Onye umengwụ maara ihe n’anya onwe ya+ karịa mmadụ asaa ndị na-aza ihe ezi uche dị na ya.
17 Onye ọ bụla nke na-agafe agafe, nke na-ewe oké iwe n’esemokwu na-agbasaghị ya, yiri onye na-adọgide nkịta aka ná ntị.+
18 Dị nnọọ ka onye ara nke na-agbapụ akụ́ ụta nke na-enwu ọkụ,+ akụ́ na ọnwụ, 19 otú ahụ ka ọ dị bụ́ onye ghọrọ mmadụ ibe ya aghụghọ wee sị: “Ọ́ bụghị egwuregwu ka m na-egwu?”+
20 Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ, ọ bụrụkwa na e nweghị onye nkwutọ, esemokwu na-akwụsị.+
21 Dị ka unyì na-adị n’icheku ọkụ, dịkwa ka nkụ na-adị n’ọkụ, otú ahụ ka onye na-ese okwu na-adị n’ime ka esemokwu+ nwuru ọkụ.
22 Okwu onye nkwutọ dị ka ihe a ga-elo ọkụ ọkụ, nke na-agbadaru n’ala ala afọ.+
23 Ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie ibe eju yiri okwu ire ụtọ nke onye na-ekwu ya nwere obi ọjọọ.+
24 Onye kpọrọ mmadụ asị na-eji egbugbere ọnụ ya eme ka a ghara ịmata onye ọ bụ, ma ọ na-etinye aghụghọ n’ime obi ya.+ 25 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka olu ya dị ụtọ,+ ekwetala ihe o kwuru,+ n’ihi na ihe arụ asaa+ dị n’obi ya. 26 Aghụghọ na-ekpuchi ịkpọasị. A ga-ekpughe ajọ omume ya n’ọgbakọ.+
27 Onye na-egwu olulu ga-adaba n’olulu ahụ,+ onye na-akwapụ nkume—ọ bụ ya ka ọ ga-alaghachikwute.+
28 Ire okwu ụgha kpọrọ onye o gburu mmụọ ya asị,+ ọnụ nke na-eto otuto efu na-akpatakwa ọdịda.+