12 Hazel wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere onyenwe m ji na-akwa ákwá?” O wee zaa, sị: “N’ihi na amaara m nke ọma ihe ọjọọ+ ị ga-eme ụmụ Izrel. Ị ga-agba ebe ha e wusiri ike ọkụ, ị ga-ejikwa mma agha gbuo ndị ikom ha bụ́ dike, ị ga-akụrikwa+ ụmụntakịrị ha, ị ga-abọwakwa ndị inyom ha dị ime afọ.”+