Jenesis 6:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 N’ihi ya, Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche+ mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+ Abụ Ọma 36:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọ bụ ihe ọjọọ ka ọ na-eme atụmatụ ya n’elu ihe ndina ya.+Ọ na-aga guzoro n’ụzọ ọjọọ.+Ọ dịghị ajụ ihe ọjọọ.+ 1 Ndị Kọrịnt 10:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ma ihe ndị a ghọọrọ anyị ihe atụ, ka anyị wee ghara ịbụ ndị na-enwe ọchịchọ ihe ọjọọ,+ ọbụna dị ka ha nwere ọchịchọ ihe ọjọọ. Ndị Galeshia 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Unu ekwela ka e duhie unu:+ Chineke abụghị onye a ga-akwa emo.+ N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa;+ Jems 4:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ka ùnu chere na ọ bụ n’efu ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Mmụọ+ nke anyaụfụ nke bi n’ime anyị na-enwe agụụ siri ike maka ihe dị iche iche”? 1 Jọn 2:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 n’ihi na ihe niile dị n’ụwa,+ ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́+ na ọchịchọ nke anya+ na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,+ esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.+
5 N’ihi ya, Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche+ mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+
4 Ọ bụ ihe ọjọọ ka ọ na-eme atụmatụ ya n’elu ihe ndina ya.+Ọ na-aga guzoro n’ụzọ ọjọọ.+Ọ dịghị ajụ ihe ọjọọ.+
6 Ma ihe ndị a ghọọrọ anyị ihe atụ, ka anyị wee ghara ịbụ ndị na-enwe ọchịchọ ihe ọjọọ,+ ọbụna dị ka ha nwere ọchịchọ ihe ọjọọ.
7 Unu ekwela ka e duhie unu:+ Chineke abụghị onye a ga-akwa emo.+ N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa;+
5 Ka ùnu chere na ọ bụ n’efu ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Mmụọ+ nke anyaụfụ nke bi n’ime anyị na-enwe agụụ siri ike maka ihe dị iche iche”?
16 n’ihi na ihe niile dị n’ụwa,+ ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́+ na ọchịchọ nke anya+ na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,+ esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.+