16 N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova+ nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.+ E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya+ maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.+
31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+