36 Mba ndị ga-afọdụ gburugburu unu ga-amara na mụ onwe m, Jehova, ewughachiwo ihe e tidara etida,+ akụwo m ihe n’ala ahụ e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu. Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, emewokwa m ya.’+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+