7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
21 “‘Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile o mere,+ debe ụkpụrụ m niile, meekwa ihe ziri ezi na ezi omume,+ ọ ga-anọgide na-adị ndụ. Ọ gaghị anwụ.+