Ilu
16 Ọ bụ mmadụ na-ahazi ihe dị n’obi,+ ma ihe ire na-aza na-esi n’ebe Jehova nọ.+
2 Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha n’anya ya,+ ma Jehova na-enyocha mmụọ.+
3 Nyefee ọrụ gị n’aka Jehova,+ atụmatụ gị ga-eguzosikwa ike.+
4 Jehova emewo ihe niile maka nzube ya,+ ee, ọbụna onye ajọ omume maka ụbọchị ihe ọjọọ.+
5 Onye ọ bụla nke dị nganga n’obi bụ ihe arụ n’anya Jehova.+ Aka na aka pụrụ ijikọta, ma mmadụ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+
6 A na-eji obiọma* na ịkwụwa aka ọtọ ekpuchi njehie,+ egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ hapụ ihe ọjọọ.+
7 Mgbe Jehova nwere obi ụtọ n’ụzọ mmadụ,+ ọ na-eme ka ya na ọbụna ndị iro ya dị n’udo.+
8 Ntakịrị ihe e nwere n’ezi omume dị mma+ karịa mkpụrụ bara ụba ma ọ bụrụ na ikpe ziri ezi adịghị.+
9 Obi mmadụ nwere ike ichepụta ụzọ ya,+ ma ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ ya.+
10 Mkpebi ikpe nke Chineke kwesịrị ịdị n’egbugbere ọnụ eze;+ ọnụ ya ekwesịghị ịbụ nke a na-adịghị atụkwasị obi n’ikpe.+
11 Ihe ziri ezi e ji atụ̀ ihe na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi bụ nke Jehova;+ nkume ihe ọ̀tụ̀tụ̀ niile ndị dị n’akpa bụ ọrụ ya.+
12 Ime ajọ omume bụ ihe arụ n’anya ndị eze,+ n’ihi na ezi omume na-eme ka ocheeze guzosie ike.+
13 Egbugbere ọnụ ezi omume na-atọ eze ukwu ụtọ;+ ọ bụkwa onye na-ekwu ihe ziri ezi ka ọ hụrụ n’anya.+
14 Ọnụma eze bụ ndị ozi na-eweta ọnwụ,+ ma, ọ bụ onye maara ihe na-eme ka ọ dajụọ.+
15 Ndụ dị n’ìhè nke si n’ihu eze,+ amara ya dịkwa ka ígwé ojii nke ụla mmiri.+
16 Lee nnọọ ka inweta amamihe si dị mma karịa ọlaedo!+ A ga-ahọrọkwa inweta nghọta karịa ọlaọcha.+
17 Okporo ụzọ nke ndị ziri ezi bụ mmadụ ịhapụ ihe ọjọọ.+ Onye na-echebe ụzọ ya na-echekwa mkpụrụ obi ya.+
18 Nganga na-abịa tupu nkụpịa,+ mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.+
19 Ọ dị mma iso ndị dị umeala n’obi bụrụ ndị dị nwayọọ na mmụọ+ karịa iso ndị na-ebuli onwe ha elu na-eke ihe a kwatara akwata.+
20 Onye na-egosi na ya nwere nghọta n’okwu ga-enweta ihe ọma,+ obi ụtọ na-adịkwara onye tụkwasịrị Jehova obi.+
21 Onye nwere obi amamihe ka a ga-akpọ onye nwere nghọta,+ onye egbugbere ọnụ ya dị ụtọ na-ekwukwa okwu na-eru n’obi.+
22 Nghọta bụụrụ ndị nwe ya olulu mmiri nke ndụ;+ ịdọ aka ná ntị ndị nzuzu bụkwa nzuzu.+
23 Onye nwere obi amamihe na-eme ka ọnụ ya na-ekwupụta nghọta,+ ọ na-emekwa ka egbugbere ọnụ ya na-ekwu okwu na-eru n’obi.+
24 Okwu ọma bụ ụgbụgbọ mmanụ aṅụ,+ ọ na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ.+
25 E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ,+ ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.+
26 Mkpụrụ obi onye na-arụsi ọrụ ike arụsiworo ya ọrụ ike,+ n’ihi na ọnụ ya amanyewo ya ịrụ ọrụ.+
27 Onye na-abaghị n’ihe na-egwupụta ihe ọjọọ,+ a pụkwara ịsị na ọkụ nke na-erepịa ihe dị n’egbugbere ọnụ ya.+
28 Onye aghụghọ na-ezisa esemokwu,+ onye nkwutọ na-ekewakwa ndị ha na ibe ha dị ná mma.+
29 Onye na-eme ihe ike ga-arata mmadụ ibe ya,+ meekwa ya ka o soro ụzọ na-adịghị mma.+ 30 Ọ na-atabigharị anya ya iji kpaa nkata aghụghọ.+ Ọ na-atakọta egbugbere ọnụ ya, ọ na-eme ihe ọjọọ ruo n’isi.
31 Isi awọ́ bụ okpueze mara mma+ mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.+
32 Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike,+ onye na-achịkwa mmụọ ya dịkwa mma karịa onye weghaara obodo.+
33 N’apata ụkwụ ka a na-efe nza,+ ma mkpebi niile e ji ya mee si n’aka Jehova.+