2 Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ+ na a ga-eme ka ugwu nke ụlọ+ Jehova guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile,+ a ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile;+ mba niile ga-enubakwa n’ime ya.+
10 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na a ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi+ nke ga-eguzo ọtọ dị ka ihe mgbaàmà dịịrị ndị dị iche iche.+ Ọ bụkwa ya ka ọbụna mba niile ga-echigharịkwuru ma jụọ ase.+ Ebe izu ike ya ga-adịkwa ebube.+
10 “Ụmụ Izrel ga-adị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịtụ atụ̀ ma ọ bụ ịgụta ọnụ.+ Ọ ga-erukwa na n’ebe a na-asịbu ha, ‘Unu abụghị ndị m,’+ a ga-asị ha, ‘Unu bụ ụmụ nke Chineke dị ndụ.’+
11 Ma ana m asị unu na ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ọdịda anyanwụ+ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’alaeze+ eluigwe;+