8Mgbe oge na-adịghị anya gachara, ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.+ Mmadụ iri na abụọ ahụ sokwa ya,
38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+
8 N’ihi na ana m asị na Kraịst ghọrọ n’ezie onye na-ejere+ ndị e biri úgwù+ ozi iji gosi na Chineke na-ekwu eziokwu,+ na nkwa niile o kwere ndị nna nna ha bụkwa eziokwu,+