Ọrụ Ndịozi
10 Na Sesaria, e nwere otu nwoke aha ya bụ Kọnịliọs, onyeisi ndị agha+ n’ìgwè ndị agha Ịtali,+ dị ka e si akpọ ya. 2 Ọ bụ nwoke obi ya dị ọcha,+ onye ya na ezinụlọ ya dum na-atụ egwu Chineke.+ Ọ na-enyekwa ndị mmadụ ọtụtụ onyinye ebere,+ na-arịọsikwa Chineke arịrịọ ike mgbe niile.+ 3 N’ihe dị ka awa nke itoolu+ n’ụbọchị,* ọ hụrụ otu mmụọ ozi+ Chineke nke ọma n’ọhụụ+ ka ọ bịakwutere ya wee sị ya: “Kọnịliọs!” 4 Nwoke ahụ ji ụjọ legide ya anya wee sị: “Ọ̀ bụ gịnị, Onyenwe anyị?” O wee sị ya: “Ekpere+ na onyinye ebere gị arịgowo dị ka ihe ncheta n’ihu Chineke.+ 5 Ya mere, zipụ ndị ikom ugbu a ka ha gaa Jọpa kpọọ otu onye aha ya bụ́ Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita. 6 Nwoke a bụ ọbịa n’ụlọ otu onye aha ya bụ́ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ, nke ụlọ ya dị n’akụkụ oké osimiri.”+ 7 Ozugbo mmụọ ozi ahụ nke gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị odibo ya, kpọọkwa otu onye agha nke obi ya dị ọcha n’ime ndị na-ejere ya ozi mgbe niile,+ 8 o wee kọọrọ ha ihe niile ma ziga ha Jọpa.+
9 N’echi ya, ka ha nọ na njem ha, na-abịaru obodo ahụ nso, Pita gbagooro n’elu ụlọ+ ịga kpee ekpere n’ihe dị ka awa nke isii.*+ 10 Ma agụụ gụsiri ya ike, o wee chọọ iri ihe. Ka ha nọ na-akwadebe nri, ọ hụrụ ọhụụ,+ 11 ọ hụrụ ka eluigwe meghere,+ otu arịa wee na-agbadata dị ka nnukwu ibé ákwà linin nke e ji isi anọ ya aka ma na-ewedata ya n’ala; 12 ụdị anụ niile ndị nwere ụkwụ anọ na ihe na-akpụ akpụ nke ụwa na anụ ufe nke eluigwe+ nọ n’ime ya. 13 Otu olu wee sị ya: “Bilie, Pita, gbuo rie!”+ 14 Ma Pita sịrị: “Ọ dịghị ma ọlị, Onyenwe anyị, n’ihi na eritụbeghị m ihe ọ bụla rụrụ arụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha.”+ 15 Olu ahụ gwara ya ọzọ, nke ugboro abụọ, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.”+ 16 Ihe a mere nke ugboro atọ, ozugbo ahụ, e bugoro arịa ahụ n’eluigwe.+
17 Ma ka Pita nọ n’oké mgbagwoju anya n’ime onwe ya banyere ihe ọhụụ ahụ ọ hụrụ pụtara, lee! ndị ikom ahụ Kọnịliọs zipụrụ ajụwo ase ụlọ Saịmọn, ha guzo n’ebe ahụ n’ọnụ ụzọ ámá.+ 18 Ha wee kpọọ òkù ma jụọ ma ọ̀ bụ n’ebe ahụ ka Saịmọn onye a na-akpọ Pita nọ dị ka ọbịa. 19 Ka Pita nọ na-atụgharị n’uche ya banyere ọhụụ ahụ, mmụọ nsọ+ kwuru, sị: “Lee! Ndị ikom atọ na-achọ gị. 20 Otú ọ dị, bilie, gbadaa n’ala ma soro ha gawa, enwela obi abụọ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ m zitere ha.”+ 21 Pita wee gbadakwuru ndị ikom ahụ n’ala, wee sị: “Lee! Ọ bụ m ka unu na-achọ. Gịnị mere unu ji bịa?” 22 Ha wee sị: “Kọnịliọs bụ onyeisi ndị agha, nwoke ezi omume nke na-atụ egwu Chineke,+ onye mba ndị Juu dum na-akọ akụkọ ọma banyere ya.+ Otu mmụọ ozi dị nsọ nyere ya ntụziaka nke si n’aka Chineke ka o zie ozi ka a kpọọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya, ka ọ nụ ihe i nwere ikwu.” 23 O wee kpọbata ha, lee ha ọbịa.
N’echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ n’ime ụmụnna si Jọpa sokwa ya gaa. 24 Nwanne echi ya, ọ banyere Sesaria. Kọnịliọs nọkwa na-atụ anya ha, ọ kpọkọwokwa ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya. 25 Mgbe Pita banyere, Kọnịliọs zutere ya, daa n’ala n’ụkwụ ya ma kpọọrọ ya isiala. 26 Ma Pita dọlitere ya, sị: “Bilie; mụ onwe m kwa bụ mmadụ.”+ 27 Ka ya na ya nọ na-akparịta ụka, ọ banyere n’ime ụlọ ma hụ ọtụtụ ndị gbakọtaranụ, 28 o wee sị ha: “Unu maara nke ọma na iwu akwadoghị ka onye Juu na onye agbụrụ ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụ ka ọ bịa ya nso;+ n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gosiri m na ekwesịghị m ịkpọ mmadụ ọ bụla onye rụrụ arụ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha.+ 29 N’ihi ya, mgbe e ziri ka a kpọọ m, m bịara n’ezie, ajụghị m ịbịa. Ya mere, ana m ajụ ihe mere unu ji zie ka a kpọọ m.”
30 N’ihi ya, Kọnịliọs sịrị: “Ụbọchị anọ gara aga, ma a gụwa ya malite n’oge awa a, anọ m na-ekpe ekpere n’ụlọ m n’awa nke itoolu,+ mgbe, lee! otu nwoke yi uwe na-enwupụ enwupụ+ guzoro n’ihu m 31 wee sị: ‘Kọnịliọs, a nụwo ekpere gị, e chetawokwa onyinye ebere gị n’ihu Chineke.+ 32 Ya mere, ziga ozi na Jọpa ka a kpọọ Saịmọn, bụ́ onye a na-akpọkwa Pita.+ Nwoke a nọ dị ka ọbịa n’ụlọ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ, n’akụkụ oké osimiri.’+ 33 Ya mere, m ziri ozi ozugbo ka a kpọọ gị, i mekwara nke ọma wee bịa ebe a. N’ihi ya, anyị niile nọ ugbu a n’ihu Chineke ịnụ ihe niile Jehova nyere gị iwu ka i kwuo.”+
34 Ya mere, Pita meghere ọnụ ya, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu,+ 35 kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.+ 36 Chineke zigaara ụmụ Izrel okwu+ ya ka e zisaara ha ozi ọma nke udo+ site n’aka Jizọs Kraịst: Onye a bụ Onyenwe ndị ọzọ niile.+ 37 Unu maara onye a nọ na-ekwu banyere ya na Judia dum, malite na Galili mgbe baptizim nke Jọn kwusara gasịrị,+ 38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+ 39 Anyị bụkwa ndị àmà nke ihe niile o mere ma n’obodo ndị Juu ma na Jeruselem; ma ha gburu ya site n’ịkwụwa ya n’osisi.+ 40 Chineke kpọlitere Onye a n’ụbọchị nke atọ ma mee ka ọ pụta ìhè,+ 41 ọ bụghị nye mmadụ niile, kama nye ndị àmà Chineke+ họpụtara tupu oge eruo, nye anyị, bụ́ ndị anyị na ya riri ma ṅụọ+ mgbe o bilitesịrị ná ndị nwụrụ anwụ. 42 O nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma+ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.+ 43 Ọ bụ ya ka ndị amụma niile na-agba àmà+ banyere ya, na onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ na-enweta mgbaghara nke mmehie site n’aha ya.”+
44 Ka Pita nọ na-ekwu banyere ihe ndị a, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị niile nụrụ okwu ahụ.+ 45 O juru ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi so Pita bịa anya, bụ́ ụfọdụ n’ime ndị e biri úgwù, n’ihi na a na-awụkwasị ndị mba ọzọ onyinye ahụ a na-enye n’efu bụ́ mmụọ nsọ.+ 46 N’ihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na-etokwa Chineke.+ Pita wee, sị: 47 “Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ igbochi iji mmiri mee ndị a baptizim,+ bụ́ ndị natara mmụọ nsọ ọbụna dị ka anyị natara?” 48 O wee nye iwu ka e mee ha baptizim n’aha Jizọs Kraịst.+ Mgbe ahụ, ha rịọrọ ya ka ọ nọrọ ruo ụbọchị ụfọdụ.