28 o wee sị ha: “Unu maara nke ọma na iwu akwadoghị ka onye Juu na onye agbụrụ ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụ ka ọ bịa ya nso;+ n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gosiri m na ekwesịghị m ịkpọ mmadụ ọ bụla onye rụrụ arụ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha.+
14 Amaara m, e mekwara ka m kweta n’ime Onyenwe anyị Jizọs na ọ dịghị ihe rụrụ arụ n’onwe ya;+ ọ bụ naanị mgbe mmadụ weere na ihe rụrụ arụ ka ihe ahụ bụụrụ onye ahụ ihe rụrụ arụ.+
15 Ihe niile dị ọcha n’ebe ndị dị ọcha nọ.+ Ma n’ebe ndị rụrụ arụ+ na ndị na-enweghị okwukwe nọ,+ ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ.+