41 Ihe unu ga-atọ m ụtọ n’ihi ihe ahụ na-esi ísì ụtọ.+ M ga-eme nke a mgbe m ga-akpọpụta unu n’etiti ndị dị iche iche, sikwa n’ala dị iche iche a chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ A ga-esikwa n’aka unu doo m nsọ n’ihu mba dị iche iche.’+
7Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+