10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe*+ n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.
25 Otú ahụ ka Chineke sikwa gụọ Rehab bụ́ nwaanyị akwụna n’onye ezi omume n’ihi ihe dị mma o mere. Ọ nabatara ndị bịara inyopụta otú obodo ha dị,* nyekwara ha aka ha esi n’ụzọ ọzọ laa.+