19 Ịlaịja wee si ebe ahụ pụọ, hụ Ịlaịsha nwa Shefat ka o ji ehi iri abụọ na anọ e jikọrọ abụọ abụọ na-akọ ọrụ. Ha niile nọ ya n’ihu, ma, yanwa nọ na-edu abụọ ndị ikpeazụ. Ịlaịja gakwuuru ya wụkwasị ya uwe e ji mara ya.+
21 Ọ laghachiziri, kpụrụ ehi abụọ chụọ àjà, jiri osisi e ji jikọta ehi ndị ahụ sie anụ ha, bupụtakwara ya ndị mmadụ, ha erie. Mgbe ha richara, o sooro Ịlaịja, malitekwa ijere ya ozi.+