-
Diuterọnọmi 10:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kacha chi niile+ na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile, Chineke dị ebube, onye dị ike, na onye e kwesịrị ịna-atụ egwu, onye na-anaghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ naghịkwa anara aka azụ.* 18 Ọ na-ekpe nwa na-enweghị nna* na nwaanyị di ya nwụrụ+ ikpe ziri ezi. Ọ hụkwara onye mbịarambịa n’anya,+ na-enye ya nri na ákwà.
-