-
2 Ndị Eze 23:29, 30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 N’oge ọ na-achị, Fero Niko eze Ijipt gara ka ọ lụso eze Asiria agha n’akụkụ Osimiri Yufretis, Josaya agawa ịlụso Fero Niko agha. Ma mgbe Niko hụrụ ya, o gburu ya n’ebe dị nso na Megido.+ 30 Ndị na-ejere ya ozi wee jiri ụgbọ ịnyịnya si Megido bulata ozu ya Jeruselem, liekwa ya n’ili ya. Ndị Juda wee kpọrọ Jehoahaz nwa ya tee ya mmanụ, chie ya eze, ya anọchie nna ya.+
-