“‘“Jehova kwuru, sị, Izrel, onye na-enupụrụ m isi, lọghachi.”+ Jehova kwukwara, sị, ‘Agaghị m ewesa gị iwe,+ n’ihi na ana m akwụsi ike n’ihe m kwuru. Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi.
3 “Gwa ha na ọ bụ ihe a ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: ‘Abụ m Jehova nke ụsụụ ndị agha. Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.’+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-agwa unu ihe a.”