-
Mak 10:13-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ndị mmadụ malitere ịkpọtara ya ụmụntakịrị ka o bitụ ha aka. Ma, ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.+ 14 Mgbe Jizọs hụrụ ihe ha mere, o were iwe ma sị ha: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochila ha n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.+ 15 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anabataghị Alaeze Chineke otú nwatakịrị si anabata ihe emekataghị banye na ya.”+ 16 O wee kuru ụmụntakịrị ahụ ma malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.+
-
-
Luk 18:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ndị mmadụ nọkwa na-akpọtara ya ụmụaka ha ka o bitụ ha aka. Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha malitere ịbara ha mba.+ 16 Ma, Jizọs kpọrọ ụmụntakịrị ahụ ka ha bịakwute ya, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochila ha n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.+ 17 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anabataghị Alaeze Chineke otú nwatakịrị si anabata ihe emekataghị banye na ya.”+
-