-
Matiu 27:33-37Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ Gọlgọta, ya bụ, Ebe Okpokoro Isi,+ 34 ha nyere Jizọs mmanya a gwara ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ.+ Ma, mgbe o detụrụ ya ọnụ, o kweghị aṅụ ya. 35 Mgbe ha kpọgidere ya n’osisi, ha fere nza kee uwe elu ya.+ 36 Ha nọdụrụ ala ebe ahụ na-eche ya nche. 37 Ha debekwara ihe e dere ebubo e boro ya n’elu osisi a kpọgidere ya. Ihe e dere na ya bụ: “Onye a bụ Jizọs, Eze ndị Juu.”+
-